20 A gakwaghị ebi n’ime ya ebi,+ ọ gaghịkwa enwe ebe obibi malite n’otu ọgbọ ruo n’ọgbọ ọzọ.+ Onye Arab agaghị ama ụlọikwuu ya n’ebe ahụ, ọ dịghịkwa ndị ọzụzụ atụrụ ga-eme ka atụrụ ha makpuru n’ebe ahụ.
12 “‘Ọ ga-erukwa na mgbe afọ iri asaa gasịrị,+ m ga-eme ka eze Babịlọn na mba ahụ,+ ya bụ, ala ndị Kaldia, zaa ajụjụ maka njehie ha,’+ ka Jehova kwuru, ‘m ga-emekwa ka ọ bụrụ ebe tọgbọrọ n’efu ruo mgbe ebighị ebi.+
43 Obodo ya dị iche iche aghọwo ihe ijuanya, ala mmiri na-adịghị na mbara ọzara.+ Obodo ya niile aghọwo ala mmadụ na-agaghị ebi, ọ dịghịkwa nwa nke mmadụ ga-agafe na ha.+
64 Kwuokwa, sị, ‘Ọ bụ otú a ka Babịlọn ga-esi mikpuo, ọ gaghịkwa apụta ọzọ n’ihi ọdachi m ga-eme ka ọ dakwasị ya;+ ha ga-arụtara onwe ha ike ọgwụgwụ.’”+