15 “Ihe ọjọọ ha niile dị na Gilgal,+ n’ihi na ọ bụ n’ebe ahụ ka m nọ kpọ ha asị.+ M ga-achụpụ ha n’ụlọ m+ n’ihi ajọ omume ha. Agaghị m anọgide na-ahụ ha n’anya.+ Ndị isi ha niile na-eme isi ike.+
8 “‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ejiriwo mkpụrụ obi ya ṅụọ iyi,’+ ka Jehova bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘“akpọrọ m mpako Jekọb asị,+ akpọkwara m ụlọ elu ya niile asị.+ M ga-enyefe obodo ahụ na ihe jupụtara n’ime ya n’aka ndị iro ya.+