15 N’ihi na unu sịrị: “Anyị na Ọnwụ agbaala ndụ;+ anyị na Shiol ahụkọwo ọhụụ;+ ọ bụrụ na oké idei mmiri nke na-achị ọkụ asọfee, ọ gaghị erute n’ebe anyị nọ, n’ihi na anyị emewo ka ụgha bụrụ ebe mgbaba anyị,+ anyị ezoola n’okwu ụgha.”+
14 Mmadụ niile emewo ihe n’echeghị echiche nke na amaghị ihe ha apụtawo ìhè.+ Ihere ihe oyiyi a pịrị apị ga-eme onye ọ bụla nke na-eji ígwè akpụ ihe;+ n’ihi na ihe oyiyi ya a wụrụ awụ bụ ihe ụgha,+ mmụọ adịghịkwa n’ime ya.+
18 Olee uru ihe oyiyi a pịrị apị+ na ihe oyiyi a wụrụ awụ na onye na-ezi ozizi ụgha+ bara nke mere onye rụrụ ya ji rụọ ya, nke mere o ji tụkwasị ya obi,+ o wee mee chi na-abaghị uru, bụ́ ndị na-adịghị ekwu okwu?+