14 A ga-etiwakwa ya dị ka ebe e tiwara nnukwu ite ndị ọkpụite kpụrụ,+ nke a kụrụ righirighi n’emereghị ya ebere, nke na a pụghị ịhụ n’iberibe ya ibe eju a ga-eji agụta ọkụ n’ekwú ọkụ ma ọ bụ nke a ga-eji kuru mmiri n’ebe apịtị dị.”+
11 Sị ha, ‘Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: “Dị ka mmadụ si akụwa ite ọkpụite kpụrụ nke na a pụghị imezi ya emezi, otú ahụ ka m ga-esi kụọ ndị a na obodo a righirighi;+ a ga-elikwa ha na Tofet+ ruo mgbe a na-agakwaghị enwe ebe a ga-eli ha.”’+
28 Nwoke a bụ́ Konaya+ ọ̀ bụ arịa nkịtị e ledara anya, nke a kụriri akụri,+ ka ọ̀ bụ arịa mmadụ na-enweghị mmasị na ya?+ Gịnị mere a ga-eji tụda ya na mkpụrụ ya n’ala, tụgakwa ha n’ala ha na-amaghị?’+