13 M ga-agbasakwa ụgbụ m n’elu ya, m ga-eji ụgbụ m ji achụ nta jide ya;+ m ga-adọrọ ya bịa Babịlọn, n’ala ndị Kaldia,+ ma ọ gaghị ahụ ala ahụ; n’ebe ahụkwa ka ọ ga-anwụ.+
20 M ga-agbasakwa ụgbụ m n’elu ya, ụgbụ m ji achụ nta ga-ejidekwa ya.+ M ga-akpụtakwa ya Babịlọn, mụ na ya ga-abakwa n’ikpe n’ebe ahụ n’ihi omume ekwesịghị ntụkwasị obi nke o mesoro m.+