6 O surekwara* ụmụ ya n’ọkụ+ na ndagwurugwu nwa Hinọm.+ O mekwara anwansi,+ gbaa afa+ ma mee mgbaasị,+ o mekwara ka e nwee ndị na-eme mgbaasị+ na ndị ọrụ ha bụ ịkọ ọdịnihu.+ O mere ihe jọrọ njọ n’anya Jehova nke ukwuu iji kpasuo ya iwe.+
5 ndị na-akpali agụụ mmekọahụ n’etiti osisi ukwu dị iche iche,+ n’okpuru osisi ọ bụla jupụtara n’akwụkwọ ndụ,+ ndị na-egbu ụmụaka n’iyi ndagwurugwu dị iche iche, n’ebe ndị gbawara agbawa na nkume dị elu?+
31 Ha ewuwo ebe ndị dị elu na Tofet,+ nke dị na ndagwurugwu nwa Hinọm,+ iji suree ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom n’ọkụ,+ nke bụ́ ihe m na-enyeghị n’iwu, ọ bataghịkwa m n’obi.’+
35 Ha wukwaara Bel ebe dị elu+ na ndagwurugwu nwa Hinọm,+ iji sureere Molek+ ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom n’ọkụ,*+ nke bụ́ ihe m na-enyeghị ha n’iwu,+ ọ bataghịkwa m n’obi ka ha mee ihe arụ a+ wee mee ka Juda mehie.’+
26 M kwekwara ka onyinye ha merụọ ha mgbe ha na-esure* nwa ọ bụla meghere akpa nwa n’ọkụ,+ ka m wee gbahapụ ha, ka ha wee mara na mụ onwe m bụ Jehova.”’+