31 nakwa n’ala ịkpa,+ bụ́ ebe ị hụrụ otú Jehova bụ́ Chineke gị si kuru gị+ dị ka nwoke si eku nwa ya, n’ebe niile unu jegharịrị ruo mgbe unu bịarutere ebe a.’+
11 Ọ ga-azụ ìgwè atụrụ ya dị ka onye ọzụzụ atụrụ.+ Ọ ga-eji ogwe aka ya chịkọta ụmụ atụrụ ya;+ ọ ga-ekuru ha n’obi ya.+ Ọ ga-eji nwayọọ na-edu ndị na-enye ụmụ ara.+
9 N’oge niile ha nọ na-ata ahụhụ, ọ nọ na-ewute ya.+ Onye ozi nke ya zọpụtara ha.+ Ọ gbapụtara ha n’ihi ịhụnanya na ọmịiko ya,+ o wee bulie ha, na-ekukwa ha ụbọchị niile kemgbe oge dị anya gara aga.+