49 “Jehova ga-eme ka mba nke nọ n’ebe dị anya,+ nke si n’ebe ụwa sọtụrụ, buso gị agha, dị nnọọ ka ugo si efekwasị n’ihe ọ ga-eburu,+ ya bụ, mba nke ị na-agaghị aghọta asụsụ ya,+
29 N’ụbọchị Pika eze Izrel, Tiglat-piliza+ eze Asiria+ batara wee weghara Aịjọn+ na Ebel-bet-meaka+ na Janoa na Kidesh+ na Hezọ+ na Gilied+ na Galili,+ ala Naftalaị+ dum, dọrọkwa ha n’agha laa Asiria.+
6 N’afọ nke itoolu nke ọchịchị Hoshia, eze Asiria weghaara Sameria,+ dọrọkwa Izrel n’agha+ laa Asiria ma mee ka ha biri na Hela+ nakwa na Hebọ, nke dị n’akụkụ osimiri Gozan+ nakwa n’obodo dị iche iche nke ndị Midia.+
20 “N’ụbọchị ahụ, Jehova ga-eji agụba e goro ọrụ nke dị n’ógbè Osimiri Yufretis,+ bụ́ eze Asiria,+ kpụọ gị isi na ajị ụkwụ, ọ ga-akpụkwa ọbụna ajị agba gị.+