21 Ndị gị niile ga-abụ ndị ezi omume;+ ha ga-enweta ala a ruo mgbe ebighị ebi,+ ha bụ ome nke ihe m kụrụ,+ ihe aka m rụrụ,+ ka e wee mee ka m maa mma.+
6 M ga na-ele ha anya ọma,+ m ga-emekwa ka ha lọta n’ala a.+ M ga-ewu ha dị ka ụlọ, agaghị m akwatu ha; m ga-akụ ha dị ka osisi, agaghịkwa m efopụ ha.+
28 Ha agaghị abụkwa ihe mba dị iche iche ga-achịkọrọ n’ike.+ Anụ ọhịa nke ụwa agaghị eripịa ha. Ha ga-ebikwa n’obi iru ala. Ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.+
25 Ha ga-ebikwa n’ala m nyere ohu m, ala m nyere Jekọb, bụ́ ebe nna nna unu hà biri,+ ha ga-ebikwa na ya,+ ha na ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha ruo mgbe ebighị ebi.+ Ohu m Devid ga-abụkwa onyeisi ha ruo mgbe ebighị ebi.+