8 Ọ gaghịkwa elekwasị ebe ịchụàjà anya,+ bụ́ ọrụ aka ya;+ ọ gaghịkwa elegide ihe mkpịsị aka ya mere anya, n’elu ogwe osisi dị nsọ ma ọ bụ n’ihe e ji adọba ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ.+
3 Asiria agaghị azọpụta anyị.+ Anyị agaghị agba ịnyịnya.+ Anyị agaghị asị aka ọrụ anyị ọzọ, “Ị bụ Chineke anyị!” n’ihi na ọ bụ gị na-eme ka e meere nwa na-enweghị nna ebere.’+
2 “Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ,” ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, “na m ga-ebipụ aha arụsị niile n’ala ha,+ a gaghịkwa echeta ha ọzọ; m ga-emekwa ka ndị amụma+ na ike ndị mmụọ ọjọọ si n’ala a pụọ.+