13 Devid kpọkwara ya ka o rie ihe ma ṅụọ ihe ọṅụṅụ n’ihu ya. O wee mee ka ọ ṅụbiga mmanya ókè.+ Otú o sina dị, ọ pụrụ n’anyasị gaa dinara n’ihe ndina ya, ya na ndị na-ejere onyenwe ya ozi, ọ laghịkwa n’ụlọ ya.
28 Absalọm wee nye ndị na-ejere ya ozi iwu, sị: “Biko, legidenụ Amnọn anya, ngwa ngwa obi dị ya ụtọ n’ihi mmanya ọ ṅụrụ,+ m wee sị unu, ‘Gbuonụ Amnọn!’ gbuonụ ya. Unu atụla egwu.+ Ọ́ bụghị mụ onwe m nyere unu iwu? Dịnụ ike, meenụ ka ndị dike.”
3 N’ihi na mmanya nke iwe nke ịkwa iko ya enwetawo mba niile,+ ya na ndị eze nke ụwa kwakwara iko,+ ndị ahịa+ nke ụwa bakwara ọgaranya n’ihi ndụ okomoko gabigara ókè ọ na-ebi n’enweghị ihere ọ bụla.”+