23 bụ́ sọlfọ na nnu+ na ọkụ,+ nke mere na a gaghị akụ ihe n’ala ya dum, ihe agaghịkwa epulite na ya, ahịhịa ndụ agaghịkwa epu na ya, dị ka mgbe a kwaturu Sọdọm na Gọmọra,+ Adma+ na Zeboyim,+ bụ́ ndị Jehova ji iwe na ọnụma kwatuo;+
40 “Dị nnọọ ka ọ dị mgbe Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra+ na obodo ndị dị ya nso,”+ ka Jehova kwuru, “ọ dịghị onye ga-ebi n’ebe ahụ, ọ dịghị nwa nke mmadụ ga-ebi na ya dị ka ọbịa.+
19 Ijipt ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ n’efu;+ Idọm ga-aghọkwa ala ịkpa nke tọgbọrọ n’efu,+ n’ihi ihe ike ha mesoro ụmụ Juda, bụ́ ndị ha nọ n’ala ha wụfuo ọbara na-emeghị ihe ọjọọ.+
7 Otú ahụkwa, mgbe Sọdọm na Gọmọra na obodo ndị dị ha gburugburu+ kwasịrị iko gabiga ókè, nweekwa mmekọahụ rụrụ arụ,+ dị ka ndị ahụ e kwuworo banyere ha, ha nwetara ntaramahụhụ ikpe ọmụma nke ọkụ ebighị ebi,+ ha wee ghọọrọ anyị ihe atụ ịdọ+ aka ná ntị.