21 iji mezuo ihe Jehova kwuru site n’ọnụ Jeremaya,+ ruo mgbe ala ahụ debezuru ụbọchị izu ike o ji ụgwọ ya.+ O debere ụbọchị izu ike n’ụbọchị niile ọ tọgbọrọ n’efu ruo mgbe afọ iri asaa zuru.+
12 “‘Ọ ga-erukwa na mgbe afọ iri asaa gasịrị,+ m ga-eme ka eze Babịlọn na mba ahụ,+ ya bụ, ala ndị Kaldia, zaa ajụjụ maka njehie ha,’+ ka Jehova kwuru, ‘m ga-emekwa ka ọ bụrụ ebe tọgbọrọ n’efu ruo mgbe ebighị ebi.+
2 n’afọ mbụ nke ọchịchị ya, mụ onwe m, Daniel, ghọtara site n’akwụkwọ dị iche iche afọ ole Jeruselem ga-atọgbọrọ n’efu,+ ya bụ, afọ iri asaa,+ nke Jehova gwara Jeremaya onye amụma okwu ya.+
5 “Gwa ndị niile bi n’ala a na ndị nchụàjà, sị, ‘Mgbe unu buru ọnụ+ ma kwaa ákwá arịrị n’ọnwa nke ise nakwa n’ọnwa nke asaa,+ meekwa ya ruo afọ iri asaa,+ ọ̀ bụ m n’ezie ka unu buuru ya?+