5 Abụ m osisi vaịn ahụ, unu bụ alaka ya. Onye nọgidere n’ime m, mụ onwe m anọgidekwa n’ime ya, ọ na-amị mkpụrụ dị ukwuu;+ n’ihi na e wezụga m, unu apụghị ime ihe ọ bụla ma ọlị.
9 ma ọ gwara m n’ezie, sị: “Obiọma m na-erughịrị mmadụ ezuworo+ gị; n’ihi na a na-eme ka ike m zuo okè n’adịghị ike.”+ Ya mere, n’ụzọ kasị enye ọṅụ, ọ kaara m mma ịnya isi n’ihe metụtara adịghị ike m,+ ka ike nke Kraịst wee kpuchie m dị ka ụlọikwuu.
17 ma Onyenwe anyị guzoro m nso+ ma nye m ike,+ ka e wee site n’aka m kwusaa ozi ọma ahụ n’ụzọ zuru ezu, ka mba niile wee nụkwa ya;+ a napụtakwara m n’ọnụ ọdụm.+