Ilu
6 Nwa m, ọ bụrụ na ị nara onye agbata obi gị n’ibé,+
Ọ bụrụ na e nwere ihe gị na onye ị na-amaghị kwekọrịtara,*+
2 Ọ bụrụ na nkwa i kwere arapụtala gị,
Ọ bụrụ na ihe i ji ọnụ gị kwuo etinyela gị ná nsogbu,+
3 Nwa m, ebe ọ bụ na ị banyela n’aka mmadụ ibe gị,
Mee ihe a ka ị gbara isi gị:
Gakwuru onye ahụ ozugbo. Weda onwe gị ala rịọ ya arịrịọ.+
4 Ekwela ka ụra gaa gị n’anya,
Ekwekwala ka ụra buru gị.
5 Napụta onwe gị otú ele si agbapụ n’aka dinta,
Otú nnụnụ si agbapụ n’aka onye na-achụ nta nnụnụ.
6 Gị onye umengwụ, gakwuru ndanda.+
Leruo otú ha si eme ihe anya ka ị mara ihe.
7 Ọ bụ eziokwu na ha enweghị ọchịagha, onyeisi, ma ọ bụ onye na-achị ha,
8 Ha na-akwadebe nri ha n’ọkọchị,+
Ha na-akpakọtakwa ihe oriri ha n’oge a na-ewe ihe ubi.
9 Gị onye umengwụ, olee mgbe ị ga-esi n’ebe i dina bilie?
Olee mgbe ị ga-esi n’ụra bilie?
10 Ihitụ ụra, irotụ ụra,
Na ịkụkụwatụ aka ka i zuo ike+
11 Ga-eme ka ị daa ogbenye na mberede ka à ga-asị na onye ohi zuru gị ohi na mberede,
Ị ga-adakwa ụkpa ka à ga-asị na mmadụ ji ngwá ọgụ bịa nakọrọ gị ihe niile i nwere.+
12 Onye nzuzu nke bụ́kwa onye ajọ omume na-ejegharị na-ekwu ihe na-enweghị isi.+
13 Ọ na-atabiri mmadụ anya,+ na-akụ ụkwụ ya n’ala, na-emegharịkwa mkpịsị aka ya mgbe ọ na-aghọ ndị ọzọ aghụghọ.
15 N’ihi ya, ọdachi ga-adakwasị ya na mberede.
A ga-ala ya n’iyi kpamkpam n’otu ntabi anya.+
16 E nwere ihe isii Jehova kpọrọ asị.
N’eziokwu, e nwere ihe asaa dị oké njọ n’anya ya:
17 Mpako,+ ịgha ụgha,*+ igbu* onye aka ya dị ọcha,+
18 Ịkpa* nkata ọjọọ,+ ime ngwa ngwa gaa mee ihe ọjọọ,*
19 Ịbụ onye akaebe nke ụgha juru ọnụ+
Nakwa ime ka ụmụnne na-ese okwu.+
21 Kee ha gburugburu obi gị mgbe niile.
Nyara ha n’olu gị.
22 Mgbe ị na-ejegharị, ọ ga-edu gị.
Mgbe i dina ala, ọ ga-eche gị nche.
Mgbe i tetakwara, ọ ga-agwa gị okwu.*
23 N’ihi na ntụziaka bụ ọkụ e ji ahụ ụzọ.*+
25 Ekwela ka obi gị dịrị n’ebe ọ nọ maka na ọ mara mma,+
Ekwekwala ka o jiri anya ọ na-akpịnyere gị rata gị,
26 N’ihi na nwaanyị akwụna na-eme ka nwoke bụrụ ogbenye ọnụ ntụ,*+
Ma nwunye nwoke ọzọ na-ala ndụ nwoke ya na ya na-akwa iko n’iyi.
27 Mmadụ ọ̀ ga-agụkwasị ọkụ n’obi ya, uwe ya aghara ire ọkụ?+
28 Ka mmadụ ọ̀ ga-eje ije n’elu icheku ọkụ, ọkụ aghara ire ya n’ụkwụ?
29 Otú ahụ ka ọ dị onye ọ bụla ya na nwunye onye agbata obi ya na-enwe mmekọahụ.
E nweghị onye metụrụ nwaanyị ahụ aka a na-agaghị ata ahụhụ.+
30 Ndị mmadụ anaghị ele onye ohi anya ọjọọ
Ma ọ bụrụ na o zuru ohi maka na agụụ na-agụ ya.
31 Ma e jide ya, ọ ga-akwụ ụgwọ ihe o zuru okpukpu asaa.
Ọ ga-eji ihe niile bara uru o nwere n’ụlọ ya kwụọ ụgwọ ya.+
32 Onye ọ bụla ya na nwaanyị na-akwa iko enweghị uche.
Onye na-eme otú ahụ na-ala ndụ ya* n’iyi.+
34 N’ihi na ekworo na-eme ka iwe ju nwoke lụrụ nwaanyị obi.
Ọ gaghịkwa eme ebere ma ọ bọwa ọbọ.+
35 Ọ gaghị anara ihe ọ bụla a chọrọ iji tie ya aka n’obi.
Obi agaghị ajụrụ ya, n’agbanyeghị otú onyinye a chọrọ inye ya bururu n’ibu.