Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • 2 Ihe E Mere 1
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ

      • Solomọn rịọrọ Chineke ka o nye ya amamihe (1-12)

      • Akụnụba Solomọn (13-17)

2 Ihe E Mere 1:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ih 29:25; Ek 2:9; Mt 6:28, 29; 12:42

2 Ihe E Mere 1:3

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 3:4; 1Ih 21:29

2 Ihe E Mere 1:4

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ih 13:5
  • +1Ih 16:1

2 Ihe E Mere 1:5

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “na-anọkwa ebe ahụ ajụ Chineke ase.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 31:2-5
  • +Ọp 38:1, 2

2 Ihe E Mere 1:6

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 3:4

2 Ihe E Mere 1:7

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 3:5-9

2 Ihe E Mere 1:8

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “I gosiri Devid nna m ịhụnanya pụrụ iche.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Sa 7:8
  • +1Ih 28:5; Ọm 89:28, 29

2 Ihe E Mere 1:9

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Sa 7:12; 1Ih 28:6; Ọm 132:11
  • +Je 13:14, 16

2 Ihe E Mere 1:10

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ilu 2:6; Jes 1:5
  • +Ọm 72:1, 2

2 Ihe E Mere 1:11

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 3:10-13, 28

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    12/1/2005, p. 19

2 Ihe E Mere 1:12

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ih 29:25; 2Ih 9:22; Ek 2:9

2 Ihe E Mere 1:13

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 3:4

2 Ihe E Mere 1:14

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “ndị na-agba ịnyịnya.”

  • *

    Ma ọ bụ “ndị na-agba ịnyịnya.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 17:16; 1Ez 4:26
  • +2Ih 8:5, 6
  • +2Ih 9:25

2 Ihe E Mere 1:15

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “n’ebe ugwu.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 10:21
  • +1Ez 10:27; 2Ih 9:27

2 Ihe E Mere 1:16

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    O nwere ike ịbụ, “Solomọn sikwa n’Ijipt nakwa na Kiu na-atụbata ịnyịnya; ndị na-azụrụ eze ahịa na-aga Kiu zụta ha.” Kiu a nwere ike ịbụ Silishia.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 9:28
  • +1Ez 10:28, 29

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

2 Ihe 1:11Ih 29:25; Ek 2:9; Mt 6:28, 29; 12:42
2 Ihe 1:31Ez 3:4; 1Ih 21:29
2 Ihe 1:41Ih 13:5
2 Ihe 1:41Ih 16:1
2 Ihe 1:5Ọp 31:2-5
2 Ihe 1:5Ọp 38:1, 2
2 Ihe 1:61Ez 3:4
2 Ihe 1:71Ez 3:5-9
2 Ihe 1:82Sa 7:8
2 Ihe 1:81Ih 28:5; Ọm 89:28, 29
2 Ihe 1:92Sa 7:12; 1Ih 28:6; Ọm 132:11
2 Ihe 1:9Je 13:14, 16
2 Ihe 1:10Ilu 2:6; Jes 1:5
2 Ihe 1:10Ọm 72:1, 2
2 Ihe 1:111Ez 3:10-13, 28
2 Ihe 1:121Ih 29:25; 2Ih 9:22; Ek 2:9
2 Ihe 1:131Ez 3:4
2 Ihe 1:14Di 17:16; 1Ez 4:26
2 Ihe 1:142Ih 8:5, 6
2 Ihe 1:142Ih 9:25
2 Ihe 1:151Ez 10:21
2 Ihe 1:151Ez 10:27; 2Ih 9:27
2 Ihe 1:162Ih 9:28
2 Ihe 1:161Ez 10:28, 29
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
2 Ihe E Mere 1:1-17

Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ

1 Ọchịchị Solomọn nwa Devid nọ na-esikwu ike. Jehova Chineke ya nọnyeere ya, meekwa ka ọ bụrụ nnukwu mmadụ.+

2 Solomọn kpọkọkwara ndị Izrel niile, ndị isi nke otu puku otu puku ndị agha na ndị isi nke otu narị otu narị ndị agha, ndị ikpe, nakwa ndị isi niile nọ n’Izrel, ya bụ, ndị isi ọnụmara dị iche iche. 3 Ya na ndị Izrel niile ahụ ọ kpọkọrọ gakwara n’ebe dị elu dị na Gibiọn,+ n’ihi na ọ bụ ebe ahụ ka ụlọikwuu nzute nke ezi Chineke dị. Ọ bụ Mosis ohu Jehova nọ n’ala ịkpa rụọ ya. 4 Ma, Devid adịla mbụ si na Kiriat-jierim+ bute Igbe ezi Chineke n’ebe ọ maara ya ụlọikwuu na Jeruselem.+ Ọ bụ ebe ahụ ka ọ rụrụ ka a na-adọsa ya. 5 A dọsakwara ebe ịchụàjà Bezalel+ nwa Yuraị nwa Họọ ji ọla kọpa rụọ+ n’ihu ụlọikwuu Jehova. Solomọn na ndị Izrel na-anọkwa n’ihu ya ekpe ekpere.* 6 Solomọn nọkwa ebe ahụ chụọ àjà n’ihu Jehova. Ọ nọ n’elu ebe ịchụàjà ahụ e ji ọla kọpa rụọ,+ nke dị n’ihu ụlọikwuu nzute, jiri otu puku (1,000) anụmanụ chụọ àjà a na-esu ọkụ.

7 N’abalị ahụ, Chineke mere ka Solomọn hụ ya ná nrọ, sịkwa ya: “Rịọ m ihe ị chọrọ ka m nye gị.”+ 8 Solomọn asị Chineke: “I gosiri Devid nna m+ na ị hụrụ ya nnọọ n’anya.* I meekwala m eze, mụ anọchie ya.+ 9 Ugbu a, Jehova Chineke, biko mezuo nkwa i kwere Devid nna m,+ n’ihi na ọ bụ gị mere m eze ka m chịwa ndị a dị ọtụtụ ka ájá dị n’ala.+ 10 Nye m amamihe, meekwa ka m mata otú m ga-esi chịa ndị a,+ n’ihi na ònye ga-ekpeli ndị gị a dị ọtụtụ ikpe ma ọ bụrụ na i nyereghị ya aka?”+

11 Chineke wee sị Solomọn: “Ebe ọ bụ ihe a bụ mkpa gị, ebe ọ bụkwa na ị rịọghị ka m nye gị akụnụba, meekwa ka a na-asọpụrụ gị, ị rịọghịkwa ka ndị kpọrọ gị asị nwụọ ma ọ bụkwanụ ka m nye gị ogologo ndụ, kama ị rịọrọ ka m nye gị amamihe, ka m meekwa ka ị mata otú ị ga-esi na-ekpe ndị m m mere gị eze ha ikpe,+ 12 m ga-enye gị amamihe, meekwa ka ị mara ihe. M ga-enyekwa gị akụnụba, meekwa ka a na-asọpụrụ gị. O nweghị eze bu gị ụzọ chịa ma ọ bụkwanụ nke ga-achị ma ị chịchaa ga-ahụ azụ gị anya n’ihe ndị a m ga-enye gị.”+

13 Solomọn wee si n’ebe dị elu dị na Gibiọn,+ ebe ụlọikwuu nzute dị, lọta Jeruselem. Ọ nọkwa na-achị Izrel. 14 Solomọn nọkwa na-enweta ụgbọ ịnyịnya na ịnyịnya.* O nwere otu puku ụgbọ ịnyịnya na narị anọ (1,400) nakwa puku ịnyịnya* iri na abụọ (12,000).+ O dowekwara ha n’obodo dị iche iche a na-edowe ụgbọ ịnyịnya+ nakwa n’ebe dị yanwa bụ́ eze nso na Jeruselem.+ 15 Ọlaọcha na ọlaedo eze webatara na Jeruselem dị ọtụtụ ka nkume.+ Osisi sida o butere dịkwa ọtụtụ ka osisi sịkamọ ndị dị na Shefila.*+ 16 Solomọn sikwa n’Ijipt+ na-atụbata ịnyịnya. Ọ bụkwa ndị na-azụrụ ya ahịa na-atụbata ha n’ìgwè n’ìgwè.*+ 17 Ha na-eji narị mkpụrụ ego ọlaọcha isii (600) esi n’Ijipt atụbata otu ụgbọ ịnyịnya, na-ejikwa otu narị mkpụrụ ego ọlaọcha na iri ise (150) atụbata otu ịnyịnya. Ha na-eresịkwa ha ndị eze niile na-achị ndị Het na ndị nke na-achị ndị Siria.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya