Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ọrụ Ndịozi 28
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi

      • Pọl hà ruru Mọlta (1-6)

      • Mgbe Pọl gwọrọ nna Pọbliọs (7-10)

      • Mgbe Pọl hà rutewere Rom (11-16)

      • Pọl gwara ndị Juu nọ na Rom okwu (17-29)

      • Pọl kwusara ozi ọma afọ abụọ n’atụghị egwu (30, 31)

Ọrụ Ndịozi 28:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 27:26

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 209-210

    Ụlọ Nche,

    8/15/2004, p. 30-31

Ọrụ Ndịozi 28:2

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “Ndị na-anaghị asụ Grik.”

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 210

    Ụlọ Nche,

    5/15/2002, p. 19

    5/1/1999, p. 30

Ọrụ Ndịozi 28:3

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 210

    Ụlọ Nche,

    6/15/1990, p. 25

Ọrụ Ndịozi 28:4

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “Ikpe Ziri Ezi.” Grik, Di′ke. O nwere ike ịbụ ihe a na-akpọ chi nwaanyị e weere ka chi na-ekpe ikpe ziri ezi.

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 210

    Ụlọ Nche,

    10/1/2015, p. 9

    5/1/1999, p. 30-31

Ọrụ Ndịozi 28:6

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 210

Ọrụ Ndịozi 28:7

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 210

Ọrụ Ndịozi 28:8

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Lu 4:38, 39

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 210

Ọrụ Ndịozi 28:9

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Mt 10:8

Ọrụ Ndịozi 28:10

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    2/1/1991, p. 22-23

Ọrụ Ndịozi 28:11

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 211

    Ụlọ Nche,

    3/1/2009, p. 9

    6/15/1990, p. 25

    5/15/1990, p. 26

Ọrụ Ndịozi 28:12

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 211

    Ụlọ Nche,

    10/15/2007, p. 30

Ọrụ Ndịozi 28:13

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 211

Ọrụ Ndịozi 28:14

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 211-212

Ọrụ Ndịozi 28:15

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ọ bụ ebe a na-eri ihe, na-ezukwa ike.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Kọ 1:3, 4

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 212-213

    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ),

    11/2020, p. 16-17

    Ụlọ Nche,

    1/1/2010, p. 11

    10/15/2006, p. 14, 16-17

    12/15/2004, p. 16-17

Ọrụ Ndịozi 28:16

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 213

    Ụlọ Nche,

    2/15/2013, p. 14

Ọrụ Ndịozi 28:17

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 24:11, 12; 25:8
  • +Ọrụ 21:33

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 213-214

    Ụlọ Nche,

    12/15/2001, p. 24

Ọrụ Ndịozi 28:18

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 24:10
  • +Ọrụ 23:26, 29; 25:24, 25; 26:31, 32

Ọrụ Ndịozi 28:19

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 25:11, 12

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 213-214

Ọrụ Ndịozi 28:20

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 23:6; 26:6; Efe 6:19, 20; 2Ti 1:16

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 214

Ọrụ Ndịozi 28:21

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 213-214

    Ụlọ Nche,

    12/15/2001, p. 24

Ọrụ Ndịozi 28:22

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 24:14
  • +Lu 2:34; Jn 15:19

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    2/15/1994, p. 5

    7/1/1993, p. 5-6, 15

Ọrụ Ndịozi 28:23

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jn 5:46
  • +Ọrụ 26:22, 23
  • +Ọrụ 17:2, 3

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 215

    Ụlọ Nche,

    1/15/2012, p. 13

Ọrụ Ndịozi 28:24

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    2/1/2003, p. 22-23

Ọrụ Ndịozi 28:25

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 215

    Amụma Aịsaịa I, p. 100

Ọrụ Ndịozi 28:26

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ro 11:8

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Amụma Aịsaịa I, p. 100

Ọrụ Ndịozi 28:27

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Aịz 6:9, 10; Mt 13:14, 15

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 215

    Amụma Aịsaịa I, p. 100

Ọrụ Ndịozi 28:28

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Lu 3:4, 6; Ọrụ 13:45, 46; 22:21; Ro 11:11
  • +Ọm 67:2; 98:3; Aịz 11:10

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 215

Ọrụ Ndịozi 28:29

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Gụọ A3.

Ọrụ Ndịozi 28:30

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 28:16

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 215-217

    Ụlọ Nche,

    2/15/2013, p. 14-15

    1/15/2007, p. 32

    12/15/2001, p. 24

    6/15/1990, p. 25

Ọrụ Ndịozi 28:31

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Efe 6:19

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 215-217

    Ụlọ Nche,

    2/15/2013, p. 14-15

    1/15/2007, p. 32

    5/15/2006, p. 14

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Ọrụ 28:1Ọrụ 27:26
Ọrụ 28:8Lu 4:38, 39
Ọrụ 28:9Mt 10:8
Ọrụ 28:152Kọ 1:3, 4
Ọrụ 28:17Ọrụ 24:11, 12; 25:8
Ọrụ 28:17Ọrụ 21:33
Ọrụ 28:18Ọrụ 24:10
Ọrụ 28:18Ọrụ 23:26, 29; 25:24, 25; 26:31, 32
Ọrụ 28:19Ọrụ 25:11, 12
Ọrụ 28:20Ọrụ 23:6; 26:6; Efe 6:19, 20; 2Ti 1:16
Ọrụ 28:22Ọrụ 24:14
Ọrụ 28:22Lu 2:34; Jn 15:19
Ọrụ 28:23Jn 5:46
Ọrụ 28:23Ọrụ 26:22, 23
Ọrụ 28:23Ọrụ 17:2, 3
Ọrụ 28:26Ro 11:8
Ọrụ 28:27Aịz 6:9, 10; Mt 13:14, 15
Ọrụ 28:28Lu 3:4, 6; Ọrụ 13:45, 46; 22:21; Ro 11:11
Ọrụ 28:28Ọm 67:2; 98:3; Aịz 11:10
Ọrụ 28:30Ọrụ 28:16
Ọrụ 28:31Efe 6:19
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
  • 24
  • 25
  • 26
  • 27
  • 28
  • 29
  • 30
  • 31
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Ọrụ Ndịozi 28:1-31

Ọrụ Ndịozi

28 Mgbe anyị pụtachara n’enweghị ihe mere anyị, anyị chọpụtara na a na-akpọ agwaetiti ahụ Mọlta.+ 2 Ndị bi n’agwaetiti a* meere anyị ihe ọma pụrụ iche. Ha nabatara anyị niile nke ọma, kwanyekwara anyị ọkụ n’ihi mmiri na-ezo nakwa n’ihi oyi na-atụ. 3 Ma mgbe Pọl buuru otu ùkwù nkụ tụkwasị n’ọkụ ahụ, otu ajụala si na nkụ ahụ pụta n’ihi ọkụ ahụ ma gbakụọ ya n’aka. 4 Mgbe ndị ebe ahụ hụrụ agwọ ahụ gbakụrụ ya n’aka, ha malitere ịgwa ibe ha, sị: “N’eziokwu, nwoke a bụ ogbu mmadụ. Ọ bụ eziokwu na o si n’oké osimiri pụta n’enweghị ihe mere ya, ihe o metara* ga-egburịrị ya.” 5 Ma, o febara agwọ ahụ n’ime ọkụ, o nweghịkwa ihe mere ya. 6 Ma ha nọ na-atụ anya na aka ya ga-aza ma ọ bụ na ọ ga-ada na mberede nwụọ. Mgbe ha chegidere hụ na o nweghị ihe mere ya, ha gbanwere obi ha, malite ịsị na ọ bụ chi.

7 Nwoke na-achị agwaetiti ahụ bi nso ebe ahụ. Aha ya bụ Pọbliọs. O nwere ọtụtụ ala. Ọ nabatara anyị nke ọma, leekwa anyị ọbịa ụbọchị atọ. 8 Ma, nna Pọbliọs dina ala maka na ahụ́ ọkụ ji ya, afọ na-asakwa ya, ya ana-anyụ ọbara. Pọl wee banye ebe ọ nọ, kpee ekpere, bikwasị ya aka n’isi, ya agbakee.+ 9 Mgbe ihe a mechara, ndị ọzọ na-arịa ọrịa n’agwaetiti ahụ bịara ka Pọl gwọọ ha, ya agwọọkwa ha.+ 10 Ha nyere anyị ọtụtụ onyinye maka ihe Pọl meere ha. Mgbe anyị na-abakwa n’ụgbọ mmiri ga-eburu anyị pụwa, ha nyere anyị ihe niile dị anyị mkpa, bubakwa ha n’ụgbọ ahụ.

11 Mgbe anyị nọchara ebe ahụ ọnwa atọ, otu ụgbọ mmiri a tụrụ ụmụ Zus n’ahụ́ ya buuru anyị gawa. Ụgbọ mmiri a si Alegzandria ma nọrọ n’agwaetiti ahụ oge oyi agafee. 12 Mgbe anyị ruru n’ọdụ ụgbọ mmiri dị na Sirakus, anyị nọrọ ebe ahụ ụbọchị atọ. 13 Anyị si ebe ahụ gaa Rijiọm. Mgbe otu ụbọchị gara, ifufe nke si ebe ndịda malitere ife, anyị ana-aga ma rute Putiolaị n’ụbọchị nke abụọ ya. 14 Anyị hụrụ ụmụnna ebe a, ha rịọkwara anyị ka anyị na ha nọrọ ruo ụbọchị asaa. Anyị sikwa ebe ahụ gawa Rom. 15 Mgbe ụmụnna nọ na Rom nụrụ na anyị na-abịa, ha bịara ebe a na-akpọ Ụlọ Atọ* ka ha zute anyị. Ụfọdụ n’ime ha bịarudịrị n’Ahịa Apịọs. Ozugbo Pọl hụrụ ha, o kelere Chineke, obi esiekwa ya ike.+ 16 Mgbe anyị mechara ruo Rom, a hapụrụ Pọl ya ebiri ebe ọ chọrọ ibi, naanị ya na onye agha na-eche ya nche anọrọ.

17 Ma, mgbe ụbọchị atọ gachara, ọ kpọrọ ndị isi ndị Juu bi ebe ahụ ka ha bịa. Mgbe ha bịara, ọ sịrị ha: “Ụmụnne m, ọ bụ eziokwu na o nweghị ihe ọjọọ m mere ndị Juu, emebighịkwa m omenala nna nna anyị hà,+ a kpọchiri m ka onye mkpọrọ na Jeruselem, nyefeekwa m n’aka ndị Rom.+ 18 Ma, mgbe ha lebachara okwu m anya,+ ha chọrọ ịhapụ m, maka na o nweghị ihe ha chọpụtara a ga-eji maka ya gbuo m.+ 19 Ma mgbe ndị Juu nọ na-asị ka a ghara ịhapụ m, o nweghị ihe ọzọ m ma m ga-eme karịa ịsị ka e wegara Siza okwu m,+ ma ọ bụghị na o nwere ihe m ga-asị na ndị obodo anyị mere. 20 Ihe mere m ji sị na m chọrọ ịhụ unu bụ ka m kọọrọ unu ihe merenụ. Ọ bụ maka onye Izrel na-atụ anya ya ka e ji kee m agbụ ígwè a.”+ 21 Ha asị ya: “O nwebeghị akwụkwọ ozi e si Judia detara anyị banyere gị, o nwebeghịkwa onye si ebe ahụ bịa gwa anyị na o nwere ihe i mere. 22 Ma anyị bịara ka ị kọọrọ anyị ihe merenụ, n’ihi na, n’eziokwu, anyị ma na ndị mmadụ na-ekwu okwu ọjọọ gbasara òtù a+ n’ebe niile.”+

23 Ya na ha wee yie ụbọchị ha ga-ahụ ọzọ. Mgbe ụbọchị ahụ ruru, ha hikwuru nne bịa ebe o bi. Ọ kọwakwaara ha nke ọma okwu gbasara Alaeze Chineke, si n’ụtụtụ ruo anyasị. O jikwa ihe dị n’Iwu Mosis+ nakwa n’Akwụkwọ Ndị Amụma+ gwa ha okwu gbasara Jizọs+ otú ọ ga-eru ha n’obi. 24 Ụfọdụ ndị malitekwara ikwere ihe ọ na-ekwu, ma ndị ọzọ ekweghị. 25 Ebe ọ bụ na ha enweghị otu olu, ha malitere ịpụ, ma Pọl kwuru otu okwu a, sị:

“Mmụọ nsọ si n’ọnụ Aịzaya onye amụma gwa nna nna unu hà okwu a dabara adaba, 26 sị: ‘Gaa gwa ndị a, sị: “Unu ga-anụ ihe, ma unu agaghị aghọta ihe ọ bụla. Unu ga-ele anya, ma unu agaghị ahụ ihe ọ bụla.+ 27 N’ihi na obi ndị a anaghịzi anabata ihe, ha ejirikwala ntị ha nụ ihe, ma ha emeghị ihe ọ bụla. Ha emechiekwala anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ, mechie ntị ha ka ha ghara ịnụ ihe ọ bụla, kpọchiekwa obi ha ka ha ghara ịghọta ihe ọ bụla, gharakwa ịgbanwe, m wee gwọọ ha.”’+ 28 N’ihi ya, maranụ na a na-ezi ndị mba ọzọ ozi a nke gbasara otú Chineke ga-esi zọpụta ndị mmadụ.+ Ha ga-egekwa ntị.”+ 29* ——

30 Ọ nọgidere n’ụlọ ọ na-akwụ ụgwọ ya ruo afọ abụọ zuru ezu.+ Ọ na-anabatakwa ndị niile bịara ịhụ ya. 31 Ọ na-ekwusara ha gbasara Alaeze Chineke, na-akụzikwara ha banyere Onyenwe anyị Jizọs Kraịst n’atụghị ụjọ.+ O nweghịkwa onye ọ bụla na-egbochi ya.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya