Abụ Ọma
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid.
139 Jehova, i nyochaala m, ị makwa m.+
2 Ị ma mgbe m nọ ọdụ na mgbe m biliri ọtọ.+
Ị na-anọ n’ebe dị anya mara ihe m na-eche.+
3 Ị na-eleru m anya mgbe m na-aga njem na mgbe m dina ala.
Ị makwa ihe niile m na-eme.+
5 Ị nọ m n’ihu nakwa n’azụ na-echebe m.
I jidekwara m aka.
6 Enweghị m ike ịghọta ihe niile ị ma gbasara m.
Ha karịrị m.+
8 Ọ bụrụ na mụ agbagoo n’eluigwe, ị ga-anọ n’ebe ahụ,
Ọ bụrụkwa na mụ eburu àkwà* m banye n’ili,* ị ga-anọ n’ebe ahụ.+
9 A sị na m ga-epu nku ma fefee na mbara igwe ngwa ngwa otú ìhè si apụta ma chi bọwa,
Ka m gaa biri n’akụkụ oké osimiri nke kacha dị anya,
10 Ị ka ga-eji aka gị na-edu m n’ebe ahụ,
Ị ga-ejikwa aka nri gị jide m aka.+
11 Ọ bụrụ na mụ asị: “N’eziokwu, ọchịchịrị ga-ekpuchi m ka a ghara ịhụ m.”
Ìhè ga-agbazi m gburugburu n’abalị.
Ọchịchịrị na ìhè bụụrụ gị otu ihe.+
13 Ọ bụ gị kere akụrụ m.
I ji ihe kpuchie m n’afọ nne m.+
14 M na-eto gị n’ihi na otú i si kee m dị ebube,+ ọ na-emekwa ka m na-atụ egwu gị.
Ọrụ gị niile dị ịtụnanya.+
O doro m nnọọ anya.
16 Ị hụdịrị m mgbe m na-akabeghị aka n’afọ nne m.
E dere ihe niile dị m n’ahụ́ n’akwụkwọ gị.
E dedịrị mgbe e kere ha
Tupu nke ọ bụla n’ime ha adịrị.
17 Ihe ndị ị na-eche n’echiche pụrụ nnọọ iche n’anya m.+
Chineke, ha dị nnọọ ọtụtụ.+
18 M gbalịa ka m gụọ ha ọnụ, m na-ahụ na ha dị ọtụtụ karịa ájá.+
M teta, m ka ga na-agụ ha ọnụ.*+
19 Chineke, a sị nnọọ na ị ga-egbu ndị ajọ omume,+
Ndị na-egbu mmadụ* ga-esi n’ebe m nọ pụọ,
20 Ya bụ, ndị ji obi ọjọọ na-ekwutọ gị.
Ha bụ ndị iro gị, ndị ji aha gị eme ihe efu.+
Ha bụzi ezigbo ndị iro m.
23 Chineke, biko, nyochaa m, ka ị mara ihe dị m n’obi.+
Nyochaa m, ka ị mara ihe na-echegbu m.+