Jenesis
25 Ebreham lụrụ nwaanyị ọzọ. Aha ya bụ Ketura. 2 Ka oge na-aga, Ketura mụụrụ ya Zimran, Jọkshan, Midan, Midian,+ Ishbak, na Shua.+
3 Jọkshan mụrụ Shiba na Didan.
Ụmụ Didan bụ Ashurim, Letushim, na Leumim.
4 Ụmụ Midian bụ Ifa, Ife, Henọk, Abaịda, na Eldea.
Ha niile bụ ụmụ Ketura.
5 Mgbe e mechara, Ebreham nyere Aịzik ihe niile o nwere,+ 6 ma Ebreham nyere ụmụ ndị iko ya mụụrụ ya onyinye. Mgbe ọ ka nọ ndụ, ọ gwara ha ka ha si n’ebe Aịzik nọ kwapụ.+ Ha wee kwaga n’ala ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ. 7 Ebreham dịrị ndụ otu narị afọ na iri asaa na ise (175). 8 Ebreham wee kubie ume ma nwụọ mgbe o mere ezigbo agadi. Ọ kara nká, ndụ ya jukwara ya afọ. E wee lie ya otú e liri ndị nna nna ya. 9 Aịzik na Ishmel ụmụ ya liri ya n’ọgba dị na Mak-pila, n’ala Ifrọn nwa Zoha onye Het, nke dị n’ihu Mamri,+ 10 ya bụ, ala Ebreham zụrụ n’aka ụmụ Het. Ọ bụ n’ebe ahụ ka e liri Ebreham na Sera nwunye ya.+ 11 Mgbe Ebreham nwụchara, Chineke nọ na-agọzi Aịzik nwa ya.+ Aịzik bi nso na Bia-lehaị-rọị.+
12 Ihe a bụ akụkọ ndụ Ishmel+ nwa Ebreham, onye Hega,+ nwaanyị Ijipt na-ejere Sera ozi, mụụrụ Ebreham.
13 Ihe a bụ aha ụmụ Ishmel n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Ọkpara Ishmel bụ Nebeyọt.+ Ụmụ ya ndị ọzọ bụ Kida,+ Adbiel, Mibsam,+ 14 Mishma, Duma, Masa, 15 Hedad, Tima, Jitọ, Nefish, na Kedema. 16 Ọ bụ ha bụ ụmụ Ishmel, ọ bụkwa ihe a bụ aha ha n’ọnụmara n’ọnụmara nakwa n’ebe ha mara ụlọikwuu ha. Ha dị ndị isi iri na abụọ. Onye nke ọ bụla nwere ọnụmara nke ya.+ 17 Ishmel dịrị ndụ otu narị afọ na iri atọ na asaa (137). O wee kubie ume nwụọ, e lie ya otú e liri ndị nna nna ya. 18 Ụmụ ya wee biri malite na Havila+ n’akụkụ Shọọ,+ bụ́ ebe dị nso n’Ijipt, ruo Asiria. Ha bi ụmụnne ha niile nso.*+
19 Ihe a bụ akụkọ ndụ Aịzik nwa Ebreham.+
Ebreham mụrụ Aịzik. 20 Aịzik dị afọ iri anọ mgbe ọ lụrụ Ribeka nwa Betuel+ onye Eram* nke dị na Padan-eram. Ribeka bụ nwanne Leban onye Eram. 21 Aịzik nọ na-arịọsi Jehova arịrịọ ike maka nwunye ya, n’ihi na ọ bụ nwaanyị aga. Jehova nụrụ arịrịọ ya, Ribeka nwunye ya wee dị ime. 22 Ụmụ o bu n’afọ malitere ịgba mgba,+ ya asị: “Ọ bụrụ otú a ka ọ na-adị, ànọ m ndụ eme gịnị?” O wee kpee ekpere jụọ Jehova ihe mere ihe a ji na-eme. 23 Jehova sịrị ya: “Mba abụọ nọ gị n’afọ,+ mba abụọ ga-esikwa n’afọ gị pụta.+ Otu mba ga-aka mba nke ọzọ ike,+ nke okenye ga-ejekwara nke nwata ozi.”+
24 Mgbe oge ọ ga-amụ nwa ruru, ọ mụrụ ejima. 25 Mgbe nwa nke mbụ pụtara, ahụ́ ya niile na-acha ọbara ọbara, ajị jukwara ya ahụ́.+ Ha wee gụọ ya Ịsọ.*+ 26 Mgbe nwa nke abụọ na-apụta, o jidere Ịsọ nwanne ya aka n’ikiri ụkwụ.+ Aịzik wee gụọ ya Jekọb.*+ Aịzik dị afọ iri isii mgbe Ribeka mụrụ ha.
27 Mgbe ụmụaka ahụ na-eto, Ịsọ ghọrọ dinta,+ nwoke na-aga n’ọhịa. Ma Jekọb bụ nwoke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta, onye bi n’ụlọikwuu.+ 28 Aịzik hụrụ Ịsọ n’anya maka na ọ na-egbutere ya anụ ọ na-ata, ma Ribeka hụrụ Jekọb n’anya.+ 29 Otu mgbe, Jekọb nọ na-esi ofe mgbe Ịsọ si n’ọhịa lọta, ike gwụkwara ya. 30 Ịsọ wee sị Jekọb: “Biko, kunyetụ m ofe a na-acha ọbara ọbara ngwa ngwa, n’ihi na ike gwụrụ m.” Ọ bụ ya mere aha ya ji bụrụ Ịdọm.*+ 31 Jekọb wee sị ya: “Buru ụzọ nyefee m ihe i kwesịrị inweta dị ka ọkpara.”+ 32 Ịsọ wee sị ya: “Ị̀ hụkwara na agụụ na-achọ ịgụgbu m? Olee uru ọ baara m na m bụ ọkpara?” 33 Jekọb sịziri ya: “Buru ụzọ ṅụọrọ m iyi.” O wee ṅụọrọ ya iyi ma kwuo na ya enyefeela ya ihe o kwesịrị inweta dị ka ọkpara.+ 34 Jekọb wee nye Ịsọ achịcha ma kunye ya ofe lentil,* ya erie, ṅụọ ma bilie pụọ. Ịsọ si otú a gosi na o jighị ọkpara ọ bụ kpọrọ ihe.