Ọnụ Ọgụgụ
2 Jehova wee gwa Mosis na Erọn, sị: 2 “Ndị Izrel ga-ama ụlọikwuu ha n’ebe ìgwè ebo atọ+ nke ebo ha so na ya mara ụlọikwuu. Nwoke ọ bụla ga-ama ụlọikwuu ya n’ebe dị nso n’ebe e nwere ihe àmà na-egosi ọnụmara o si. Ha ga-ama ụlọikwuu ha gburugburu ụlọikwuu nzute, cheekwa ya ihu.
3 “Ndị ga-ama ụlọikwuu n’ebe ọwụwa anyanwụ n’ìgwè ha n’ìgwè ha bụ ìgwè ebo atọ nke Juda. Onyeisi ụmụ Juda bụ Nashọn+ nwa Aminadab. 4 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ya na-aga agha dị puku iri asaa na anọ na narị isii (74,600).+ 5 Ndị ga-ama ụlọikwuu n’otu akụkụ ebo Juda bụ ebo Ịsaka. Onyeisi ụmụ Ịsaka bụ Netanel+ nwa Zua. 6 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ya na-aga agha dị puku iri ise na anọ na narị anọ (54,400).+ 7 Ebo ga-ama ụlọikwuu n’akụkụ nke ọzọ nke ebo Juda bụ ebo Zebulọn. Onyeisi ụmụ Zebulọn bụ Elayab+ nwa Hilọn. 8 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ya na-aga agha dị puku iri ise na asaa na narị anọ (57,400).+
9 “Ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ná ndị agha nọ n’ìgwè Juda dị otu narị puku, iri puku asatọ na isii na narị anọ (186,400). Ọ bụ ha ga na-ebu ụzọ akwali.+
10 “Ndị ga-ama ụlọikwuu n’ebe ndịda n’ìgwè ha n’ìgwè ha bụ ìgwè ebo atọ nke Ruben.+ Onyeisi ụmụ Ruben bụ Elaịzọ+ nwa Shedeọ. 11 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ya na-aga agha dị puku iri anọ na isii na narị ise (46,500).+ 12 Ndị ga-ama ụlọikwuu n’otu akụkụ ebo Ruben bụ ebo Simiọn. Onyeisi ụmụ Simiọn bụ Shelumiel+ nwa Zurishadaị. 13 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ya na-aga agha dị puku iri ise na itoolu na narị atọ (59,300).+ 14 Ebo ga-ama ụlọikwuu n’akụkụ nke ọzọ nke ebo Ruben bụ ebo Gad. Onyeisi ụmụ Gad bụ Elayasaf+ nwa Ruel. 15 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ya na-aga agha dị puku iri anọ na ise, narị isii na iri ise (45,650).+
16 “Ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ná ndị agha nọ n’ìgwè Ruben dị otu narị puku, iri puku ise na otu, narị anọ na iri ise (151,450). Ọ bụ ha bụ ndị nke abụọ ga na-akwali.+
17 “Mgbe a ga-eburu ụlọikwuu nzute gaa n’ebe ọzọ,+ ụlọikwuu ndị Livaị ga-adị n’etiti ebe ndị ọzọ mara ụlọikwuu.
“Ọ bụ otú ha si maa ụlọikwuu ka ha ga na-esi aga mgbe ha na-aga ebe ọzọ.+ Onye nke ọ bụla ga-anọ n’ebe o kwesịrị ịnọ, n’ebe ìgwè ebo atọ nke ebo o so na ya nọ.
18 “Ndị ga-ama ụlọikwuu n’ebe ọdịda anyanwụ n’ìgwè ha n’ìgwè ha bụ ìgwè ebo atọ nke Ifrem. Onyeisi ụmụ Ifrem bụ Elishama+ nwa Amaịhọd. 19 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ya na-aga agha dị puku iri anọ na narị ise (40,500).+ 20 Ebo Manase+ ga-ama ụlọikwuu n’otu akụkụ ebo Ifrem. Onyeisi ụmụ Manase bụ Gameliel+ nwa Pedazọ. 21 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ya na-aga agha dị puku iri atọ na abụọ na narị abụọ (32,200).+ 22 Ebo ga-ama ụlọikwuu n’akụkụ nke ọzọ nke ebo Ifrem bụ ebo Benjamin. Onyeisi ụmụ Benjamin bụ Abidan+ nwa Gidionaị. 23 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ya na-aga agha dị puku iri atọ na ise na narị anọ (35,400).+
24 “Ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ná ndị agha nọ n’ìgwè Ifrem dị otu narị puku, puku asatọ na otu narị (108,100). Ọ bụ ha bụ ndị nke atọ ga na-akwali.+
25 “Ndị ga-ama ụlọikwuu n’ebe ugwu n’ìgwè ha n’ìgwè ha bụ ìgwè ebo atọ nke Dan. Onyeisi ụmụ Dan bụ Ahayiza+ nwa Amishadaị. 26 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ya na-aga agha dị puku iri isii na abụọ na narị asaa (62,700).+ 27 Ndị ga-ama ụlọikwuu n’otu akụkụ ebo Dan bụ ebo Asha. Onyeisi ụmụ Asha bụ Pegiel+ nwa Ọkran. 28 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ya na-aga agha dị puku iri anọ na otu na narị ise (41,500).+ 29 Ebo ga-ama ụlọikwuu n’akụkụ nke ọzọ nke ebo Dan bụ ebo Naftalaị. Onyeisi ụmụ Naftalaị bụ Ahaịra+ nwa Inan. 30 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ya na-aga agha dị puku iri ise na atọ na narị anọ (53,400).+
31 “Ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ná ndị agha nọ n’ìgwè Dan dị otu narị puku, iri puku ise na asaa na narị isii (157,600). Ọ bụ ha bụ ndị ikpeazụ ga na-akwali+ n’ìgwè ebo atọ ebo atọ e nwere n’Izrel.”
32 Ọ bụ ndị a bụ ndị Izrel e debara aha ha n’akwụkwọ n’ọnụmara n’ọnụmara ha. Ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ ná ndị bi n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu, bụ́ ndị nwere ike ịga agha, dị narị puku isii na atọ, narị ise na iri ise (603,550).+ 33 Ma e debaghị aha ndị Livaị n’akwụkwọ+ mgbe e dere aha ndị Izrel ndị ọzọ,+ otú Jehova nyere Mosis n’iwu. 34 Ndị Izrel mere ihe niile Jehova nyere Mosis n’iwu. Ọ bụ otú ahụ ka ha si maa ụlọikwuu ha n’ìgwè ebo atọ ebo atọ ha.+ Ọ bụkwa otú ahụ ka ha si akwali,+ ndị nke ọ bụla n’ezinụlọ ha nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara.