Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Diuterọnọmi 20
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Diuterọnọmi

      • Iwu e nyere ndị Izrel gbasara ịga agha (1-20)

        • Ndị na-agaghị aga agha (5-9)

Diuterọnọmi 20:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 3:22; 31:6; Ọm 20:7; Ilu 21:31

Diuterọnọmi 20:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 31:6

Diuterọnọmi 20:4

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 14:14; Jos 23:10

Diuterọnọmi 20:7

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 24:5

Diuterọnọmi 20:8

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “ka obi wụba ụmụnna ya n’afọ otú obi wụbara ya.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 13:33; 14:1-3; 32:9; Di 1:28
  • +Ikp 7:3

Diuterọnọmi 20:10

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jos 11:19

Diuterọnọmi 20:11

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 25:44, 46; Jos 9:22, 27

Diuterọnọmi 20:14

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 14:13
  • +Jos 22:8

Diuterọnọmi 20:16

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jos 6:17; 10:28; 11:11

Diuterọnọmi 20:17

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 7:1

Diuterọnọmi 20:18

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 34:15; Di 7:4; Jos 23:12, 13; Aịz 2:6; 1Kọ 5:6; 15:33

Diuterọnọmi 20:19

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Neh 9:25

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Bịaruo Jehova Nso, p. 135

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Diut. 20:1Di 3:22; 31:6; Ọm 20:7; Ilu 21:31
Diut. 20:2Ọg 31:6
Diut. 20:4Ọp 14:14; Jos 23:10
Diut. 20:7Di 24:5
Diut. 20:8Ọg 13:33; 14:1-3; 32:9; Di 1:28
Diut. 20:8Ikp 7:3
Diut. 20:10Jos 11:19
Diut. 20:11Le 25:44, 46; Jos 9:22, 27
Diut. 20:142Ih 14:13
Diut. 20:14Jos 22:8
Diut. 20:16Jos 6:17; 10:28; 11:11
Diut. 20:17Di 7:1
Diut. 20:18Ọp 34:15; Di 7:4; Jos 23:12, 13; Aịz 2:6; 1Kọ 5:6; 15:33
Diut. 20:19Neh 9:25
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Diuterọnọmi 20:1-20

Diuterọnọmi

20 “Ọ bụrụ na unu agaa ịlụso ndị iro unu agha, unu ahụ ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya na ndị agha dị ọtụtụ karịa unu, unu atụla ha egwu, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu, onye kpọpụtara unu n’Ijipt, nọnyeere unu.+ 2 Mgbe unu chọrọ ibido ịlụ agha, onye nchụàjà ga-abịa gwa ndị agha okwu.+ 3 Ọ ga-agwa ha, sị, ‘Ndị Izrel nụrụnụ, unu na-aga ịlụso ndị iro unu agha. Obi amapụla unu. Unu atụla egwu, unu atụkwala ụjọ ma ọ bụ maa jijiji n’ihi ha, 4 n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu so unu na-aga. Ọ ga-alụso ndị iro unu agha, zọpụtakwa unu.’+

5 “Ndị isi ndị agha ga-agwakwa ha, sị, ‘È nwere onye rụrụ ụlọ ọhụrụ, ma ọ gbapebeghị ya? Ya laghachi n’ụlọ ya. Ọ bụrụ na ọ laghachighị, o nwere ike ịnwụ n’agha, nwoke ọzọ agbapee ụlọ ya. 6 È nwere onye kọrọ ubi vaịn, ma ọ malitebeghị ịghọrọ mkpụrụ ya? Ya laghachi n’ụlọ ya. Ọ bụrụ na ọ laghachighị, o nwere ike ịnwụ n’agha, onye ọzọ amalite ịghọrọ mkpụrụ ya. 7 È nwere onye kwere nwaanyị nkwa na ọ ga-alụ ya, ma ọ lụbeghị ya? Ya laghachi n’ụlọ ya.+ Ọ bụrụ na ọ laghachighị, o nwere ike ịnwụ n’agha, nwoke ọzọ alụrụ nwaanyị ahụ.’ 8 Ndị isi ndị agha ga-ajụkwa ha, sị, ‘È nwere onye ụjọ na-atụ, nke obi na-amapụkwa?+ Ya laghachi n’ụlọ ya, ka ọ ghara ime ka obi mapụwa ụmụnna ya otú ọ na-amapụ ya.’*+ 9 Mgbe ndị isi ndị agha gwachara ha okwu, ha ga-ahọpụta ndị ọchịagha ga-edu ha.

10 “Ọ bụrụ na unu erute obodo nso ka unu lụso ya agha, unu ga-agwa ndị obodo ahụ ihe ha ga-eme ka unu na ha mee udo.+ 11 Ọ bụrụ na ha ekwuo na ha chọrọ udo ma megheere unu ọnụ ụzọ ámá ha, ndị niile nọ n’obodo ahụ ga-abụ ndị ohu unu, ha ga na-ejekwara unu ozi.+ 12 Ma, ọ bụrụ na ha ekweghị ka unu na ha mee udo, kama ha alụsowa unu agha, nọchibidonụ obodo ahụ, 13 Jehova bụ́ Chineke unu ga-enyefe ya n’aka unu. Unu ga-eji mma agha gbuo nwoke ọ bụla nọ na ya. 14 Ma, unu nwere ike ịchịkọrọ ụmụ nwaanyị ha, ụmụ ha, na anụ ụlọ ha, bukọrọkwa ihe niile dị n’obodo ahụ, ya bụ, ihe niile unu kwatara.+ Unu ga-ewere ihe niile unu kwatara n’obodo ndị iro unu, bụ́ ndị Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu.+

15 “Ọ bụ ihe a ka unu ga-eme obodo niile dị unu ezigbo anya, ya bụ, obodo ndị na-esoghị ná mba ndị a dị unu nso. 16 Ma, unu agaghị ahapụ ihe ọ bụla na-eku ume ka ọ dịrị ndụ n’obodo ndị a Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka ha bụrụ nke unu.+ 17 Kama, unu ga-ebibi ha kpamkpam, ya bụ, ndị Het, ndị Amọraịt, ndị Kenan, ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt, na ndị Jebus,+ otú Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu n’iwu, 18 ka ha wee ghara ịkụziri unu arụ niile ha na-eme mgbe ha na-efe chi ha, mezie ka unu mehie Jehova bụ́ Chineke unu.+

19 “Ọ bụrụ na unu anọchibido obodo ka unu weghara ya, unu alụsowakwa ya agha ruo ọtụtụ ụbọchị, unu ejila anyụike gbutusịa osisi ndị dị na ya. Unu nwere ike iri mkpụrụ ha, ma unu egbutula ha.+ Ùnu kwesịrị ibibisị osisi dị n’ọhịa otú e si ebibi mmadụ? 20 Unu nwere ike ibibi naanị osisi ndị unu ma na a naghị eri mkpụrụ ha eri. Unu nwere ike igbutu ha ma jiri ha rụọ ihe unu ga-eji nọchibido obodo ahụ nke na-alụso unu agha, ruo mgbe unu meriri obodo ahụ.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya