Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • nwt Abụ Ákwá 1:1-5:22
  • Abụ Ákwá

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Abụ Ákwá
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Abụ Ákwá

ABỤ ÁKWÁ

א [Alef]*

1 Jeruselem, bụ́ obodo ndị mmadụ juburu na ya, tọgbọzi nkịtị.+

Nwaanyị ụmụ ya hiri nne ma e jiri ya tụnyere mba ndị ọzọ dịzi ka nwaanyị di ya nwụrụ.+

Onye bụ́bu eze nwaanyị na-achị mpaghara* dị iche iche bụzi onye a na-amanye ịrụ ọrụ.+

ב [Bet]

 2 Ọ na-ebegbu onwe ya n’ákwá n’abalị.+ Anya mmiri na-asọdakwa ya na ntì.

N’ime ndị niile hụrụ ya n’anya, e nweghị nke na-akasi ya obi.+

Ndị enyi ya niile agharịpụla ya.+ Ha bụzi ndị iro ya.

ג [Gimel]

 3 A dọrọla Juda n’agha laa ala ọzọ,+ ya ana-ata ahụhụ, a na-echi ya ọnụ n’ala ka ọ na-agba ohu.+

Ya na ndị mba ọzọ bizi.+ Ọ hụghị ebe ọ ga-ezu

ike.

Ndị niile na-akpagbu ya akparala ya aka ka ọ nọ n’ahụhụ.

ד [Dalet]

 4 Ụzọ niile e si aga Zayọn na-eru uju, n’ihi na e nweghịzi onye na-aga ememme ebe ahụ.+

E mebisiela ọnụ ụzọ ámá ya niile.+ Ndị nchụàjà ndị nọ ebe ahụ na-asụkwa ude.

Ụmụ agbọghọ ya* na-eru uju. Obodo ahụ n’onwe ya ahụsiela anya.

ה [Hee]

 5 Ndị na-ebibi Zayọn bụzi ndị isi ya. Ndị iro ya anaghị echegbu onwe ha.+

N’ihi na Jehova emeela ka ọ na-eru uju maka mmehie niile o mere.+

Onye iro ya adọrọla ụmụ ya n’agha.+

ו [Wọọ]

 6 Ihe niile mere Zayọn* ji maa mma adịghịzi.+

Ndị isi ya dị ka ele ndị na-ahụghị ebe ha ga-ata ahịhịa.

Ike gwụrụ ha ka ha na-aga n’ihu onye na-emegbu* ha.

ז [Zayin]

 7 N’oge Jeruselem nọ n’ahụhụ nakwa n’oge ọ na-enweghịzi ụlọ, o chetara

Ihe ya niile bara ezigbo uru ndị dịwara kemgbe ụwa.+

Mgbe ndị ya dabara n’aka onye iro ha, mgbe ọ na-enweghịkwa onye na-enyere ya aka,+

Ndị iro ya hụrụ ya mgbe ọ dara, chịwa ya ọchị.+

ח [Het]

 8 Mmehie Jeruselem akarịala.+

Ọ bụ ya mere o ji bụrụ ihe na-asọ oyi.

Ndị niile na-akwanyeburu ya ùgwù ejighịzi ya kpọrọ ihe, n’ihi na ha ahụla ọtọ ya.+

Ọ na-asụ ude,+ cheekwa ihu ebe ọzọ n’ihi ihere na-eme ya.

ט [Tet]

 9 Uwe mwụda ya etetọọla.

Ọ naghị eche gbasara ọdịnihu ya.+

Ọdịda ya dị egwu. O nweghị onye na-akasi ya obi.

Jehova, lee ahụhụ m na-ata. Onye iro m na-etu ọnụ na o meriela.+

י [Yod]

10 Onye iro ebukọrọla akụ̀ ya niile.+

Jeruselem ahụla mba ndị batara n’ụlọ nsọ ya,+

Ndị i nyere iwu ka ha ghara ịbata n’ọgbakọ gị.

כ [Kaf]

11 Ndị Jeruselem niile na-asụ ude. Ha na-achọgharị ihe oriri.+

Ha ejirila ihe ndị bara ezigbo uru ha nwere gbanweta ihe ha ga-eri ka ha* nwee ike dịrị ndụ.

Jehova, biko, leenụ otú m dịzi ka nwaanyị* na-abaghị uru.

ל [Lamed]

12 Ọ̀ bụ na o nweghị ihe ihe a bụ n’anya unu niile ndị na-agafe n’ụzọ?

Leenụ anya hụ ihe na-eme.

È nwere onye a tara ụdị ahụhụ a tara m,

Ya bụ, ahụhụ Jehova tara m n’ụbọchị o were ezigbo iwe?+

מ [Mem]

13 O si n’eluigwe zite ọkụ ka o ree ọkpụkpụ m niile.+

Ọ gbasaala ụgbụ ka o jide ụkwụ m. Ọ manyela m ịlaghachi azụ.

O meela ka m dị ka nwaanyị na-ata ahụhụ.

M na-arịa ọrịa ụbọchị niile.

נ [Nun]

14 Jehova ekeela mmehie m niile eriri otú e si eke yok. O ji aka ya kee ha.

O kegidere ha n’olu m. Ike agwụkwala m.

O nyefeela m n’aka ndị ka m ike.+

ס [Samek]

15 Jehova akpọpụla ndị dike niile nọ n’obodo a.+

Ọ kpọkọọlara m ndị agha ka ha lụso m agha, bibiekwa ụmụ okorobịa m.+

Jehova azọchaala Juda* otú e si azọchapụta mmanya.+

ע [Ayin]

16 M na-ebe ákwá n’ihi ihe ndị a.+ Anya mmiri na-agbapụta m n’anya.

N’ihi na onye ga-akasi m obi ma ọ bụ onye ga-eme ka m* nwee ume nọ m ebe dị anya.

Ụmụ m ahụsiela anya, n’ihi na onye iro emeriela.

פ [Pee]

17 Zayọn agbasaala aka ya.+ O nweghị onye ọ bụla na-akasi ya obi.

Jehova enyela ndị niile gbara Jekọb gburugburu iwu ka ha na-emeso Jekọb ka ndị iro ya.+

Jeruselem na-asọzi oyi n’anya ha.+

צ [Sadee]

18 Ahụhụ Jehova tara m kwesịrị ekwesị+ n’ihi na edebeghị m iwu ya.+

Unu niile, geenụ ntị, hụkwanụ ahụhụ m na-ata.

A dọrọla ma ụmụ agbọghọ m na-amaghị nwoke* ma ụmụ okorobịa m n’agha.+

ק [Kof]

19 Akpọrọ m ndị hụrụ m n’anya ka ha bịa nyere m aka, ma ha gharịpụrụ m.+

Ndị nchụàjà m na ndị okenye m alaala n’iyi n’ime obodo,

Ebe ha na-achọgharị ihe ha ga-eri ka ha nwee ike dịrị ndụ.*+

ר [Resh]

20 Jehova, leenụ na anọ m n’ezigbo nsogbu.

Ime ahụ́ m* aghasaala.

Obi agbawaala m n’ihi na isi ike m akarịala.+

Mma agha gbawara m aka ụmụ n’èzí.+ Ọnwụ na-egbukwa ndị mmadụ n’ime ụlọ.

ש [Shin]

21 Ndị mmadụ anụla ude m na-asụ. E nweghị onye na-akasi m obi.

Ndị iro m niile anụla ọdachi dakwasịrị m.

Ha na-aṅụrị ọṅụ n’ihi na i mere ka ọ dakwasị m.+

Ma otu ụbọchị, ị ga-eme ha ihe i kwuru na ị ga-eme ha.+ Ha ga-adị ka m n’ụbọchị ahụ.+

ת [Tọọ]

22 Ka ihe ọjọọ niile ha na-eme pụta ìhè n’ihu gị. Mesiekwa ha ike,+

Otú ahụ i si mesie m ike n’ihi mmehie m niile.

N’ihi na asụkarịala m ude, obi na-egbukwa m mgbu.

א [Alef]

2 Jehova ejirila iwe mee ka ígwé ojii kpuchie Zayọn.*

O sila n’eluigwe bibie ihe ndị mere ka Izrel maa mma.+

O chetaghị ihe o ji agbakwasị ụkwụ+ n’ụbọchị iwe ya.

ב [Bet]

 2 Jehova ebibiela ebe niile Jekọb na-ebi n’emeghị ebere.

O jirila iwe dị ọkụ kwatuo ebe dị iche iche Juda* rụsiri ike.+

O meela ka alaeze ya na ndị isi ya daruo ala iji menye ha ihere.+

ג [Gimel]

 3 O ji ezigbo iwe wepụ ihe niile na-enye Izrel ike.*

O nyereghị Izrel aka mgbe onye iro bịara lụso ya agha.+

Iwe ọ na-ewesa Jekọb dịkwa ka ọkụ nke repịara ihe niile gbara ya gburugburu.+

ד [Dalet]

 4 O kweela ụta ya ka onye iro. Aka nri ya adịla njikere ịlụ ọgụ ka onye iro.+

Ọ nọ na-egbu ndị niile anyị na-anaghị eji egwu egwu.+

Ọ na-ewesakwa ụlọikwuu Zayọn*+ iwe ka ebe ọkụ na-ere.+

ה [Hee]

 5 Jehova dịzi ka onye iro.+

O bibiela Izrel.

O bibiela ụlọ elu ya niile.

O bibiela ebe niile a rụsiri ike na ya.

O meekwala ka a na-eru uju, na-ebekwa ákwá na Juda.

ו [Wọọ]

 6 Jehova akwatuola ụlọ ndò ya+ otú e si akwatu ụlọ akịrịka dị n’ubi.

Ọ kwụsịla ime ememme ya.+

O meela ka ndị bi na Zayọn chefuo ememme na ụbọchị izu ike.

O jikwa ezigbo iwe jụ ndị eze na ndị nchụàjà.+

ז [Zayin]

 7 Jehova ajụla ebe ịchụàjà ya.

O legharala ụlọ nsọ ya anya.+

O nyefeela mgbidi ụlọ elu ya dị iche iche n’aka onye iro.+

Ha na-eme mkpọtụ n’ụlọ Jehova,+ ka à ga-asị na ọ bụ ụbọchị ememme.

ח [Het]

 8 Jehova ekpebiela ịla mgbidi Zayọn* n’iyi.+

O jirila eriri e ji atụ̀ ihe tụọ mgbidi ndị ahụ.+

Ọ hapụghị ibibi ihe.

Ọ na-emekwa ka mgbidi e ji ájá rụọ na mgbidi siri ike na-eru uju.

Ha adaala.

ט [Tet]

 9 Ọnụ ụzọ ámá ya dị iche iche emiela ala.+

Chineke ebibiela ihe niile e ji atụchi ha, kụriekwa ha.

A dọrọla eze ya na ndị isi ya n’agha laa mba dị iche iche.+

E nweghịzi onye na-edebe iwu.* Jehova anaghịdị eme ka ndị amụma Zayọn hụ ọhụụ.+

י [Yod]

10 Ndị okenye Zayọn* nọ ọdụ n’ala nkịtị. Ha anaghịkwa ekwu okwu.+

Ha kpokwasịrị onwe ha ájá n’isi, yirikwa ákwà iru uju.+

Ụmụ agbọghọ Jeruselem* ekpudochaala ihu n’ala.

כ [Kaf]

11 Anya akpọọla m ebe m na-ebe ákwá.+

Ime ahụ́ m* aghasaala.

Obi agbawaala m,* n’ihi na e bibiela ndị m,*+

N’ihi na ụmụntakịrị na ụmụ ọhụrụ na-atụbọ n’ámá obodo.+

ל [Lamed]

12 Ka ha na-atụbọ ka ndị e merụrụ ahụ́ n’ámá obodo,+

Ka ha na-achọ ikubi ume n’aka nne ha,

Onye ọ bụla n’ime ha nọ na-agwa nne ya, sị: “Mama, agụụ ji m, akpịrị na-akpọkwa m nkụ.”*

מ [Mem]

13 Jeruselem,* ònye na-ata ụdị ahụhụ ị na-ata?

Ònye ka m ga-asị na ị dị ka ya?

Zayọn,* gịnị ka m ga-eji tụnyere gị, ka m wee kasie gị obi?

N’ihi na ahụ́ i merụrụ hiri nne ka oké osimiri.+ Ònye ga-agwọ gị?+

נ [Nun]

14 Ọhụụ ndị amụma gị na-ahụrụ gị bụ ọhụụ ụgha, ha abaghịkwa uru.+

Ndị amụma gị agbaghị mmehie gị n’anwụ iji mee ka a ghara ịdọrọ gị n’agha,+

Kama, ha nọ na-ahụrụ gị ọhụụ ụgha, na-agwakwa gị ihe ndị na-eduhie gị.+

ס [Samek]

15 Ndị niile na-agafe n’okporo ụzọ na-akụ aka iji kwaa gị emo.+

Jeruselem,* ihe mere gị na-eju ha anya, ha ana-afụ mkpọrọhịhị,+ na-efufe isi, na-asị:

“Ihe a ọ̀ bụ obodo ahụ ndị mmadụ na-ekwu gbasara ya, sị, ‘Ọ bụ ebe mma ruru gwụ, bụrụkwa ebe na-eme ka ụwa niile na-aṅụrị ọṅụ’?”+

פ [Pee]

16 Ndị iro gị niile na-agwa gị okwu ọjọọ.

Ha na-afụ mkpọrọhịhị, na-atakwa ikikere ezé, na-asị: “Anyị ebibiela ya.+

Ụbọchị anyị nọ na-atụ anya ya kemgbe eruola.+ Anyị ahụla ya.”+

ע [Ayin]

17 Jehova emeela ihe o bu n’obi ime.+ O mezuola ihe o kwuru,+

Ya bụ, ihe o kpebiri ime kemgbe.+

O bibiela gị n’emereghị gị ebere.+

O meela ka onye iro na-aṅụrị ọṅụ n’ihe mere gị. O meela ka onye iro gị sikwuo ike.*

צ [Sadee]

18 Mgbidi Zayọn,* gee ntị. Ndị bi n’ime gị na-ebeku Jehova ákwá.

Mee ka anya mmiri na-asọ ka iyi ma n’ehihie ma n’abalị.

Ezula ike, ka anya mmiri gharakwa ịkwụsị ịgba gị n’anya.

ק [Kof]

19 Bilie! Tie mkpu n’abalị niile.

Jiri anya mmiri kọọrọ Jehova ihe niile dị gị n’obi.

Gbasaara ya aka gị n’ihi ndụ* ụmụ gị,

Ya bụ, ụmụ gị ndị ụnwụ mere ka ha na-atụbọ n’ebe niile ụzọ gbara mkpị.+

ר [Resh]

20 Jehova, biko, lee ndị gị, bụ́ ndị i mesiri ike.

Ụmụ nwaanyị hà kwesịrị ịna-eri ụmụ ha?*+

Ka è kwesịrị igbu onye nchụàjà na onye amụma n’ụlọ nsọ Jehova?+

ש [Shin]

21 Ozu nwatakịrị nwoke na agadi tọgbọ n’okporo ámá.+

E jirila mma agha gbuo ụmụ agbọghọbịa m* na ụmụ okorobịa m.+

I gbuola ha n’ụbọchị iwe gị. I gbuola ha n’emereghị ha ebere.+

ת [Tọọ]

22 I si ebe niile mee ka ihe ndị na-emenye m ụjọ gbakọta otú i si eme ka ndị mmadụ gbakọta n’ụbọchị ememme.+

E nweghịkwa onye lanahụrụ ma ọ bụ onye gbapụrụ n’ụbọchị iwe Jehova.+

Onye iro m gbuchara ụmụ m mụrụ ma zụọ.+

א [Alef]

3 Ahụrụ m ndị nọ n’ahụhụ maka na Chineke ji ezigbo iwe taa anyị ahụhụ.

 2 Ọ chụpụla m ma mee ka m na-eje ije n’ọchịchịrị, ọ bụghị n’ìhè.+

 3 N’eziokwu, ọ na-emesi m ike ụbọchị niile.+

ב [Bet]

 4 O meela ka anụ ahụ́ m rekasịa.

Ọ gbajisịakwala ọkpụkpụ m.

 5 Ọ rụchibidola m mgbidi. O jirikwala nsí+ na ihe isi ike gbaa m gburugburu.

 6 Ọ manyere m ka m nọdụ n’ebe gbara ọchịchịrị dị ka ndị nwụrụ kemgbe.

ג [Gimel]

 7 Ọ rụchibidola m mgbidi ka m ghara ịpụ.

Ọ tụọla m ịga dị arọ ndị e ji ọla kọpa mee.+

 8 M tie mkpu kpọọ ya ka o nyere m aka, ọ naghị anụ ekpere m.+

 9 O jirila nkume a wara awa dochie n’ụzọ m.

O meela ka ije ije n’ụzọ m na-aga na ya siere m ike.+

ד [Dalet]

10 Ọ na-aga zoo chebiri m otú anụ ọhịa bea ma ọ bụ ọdụm si echebiri anụ ọ chọrọ iri.+

11 Ọ chụpụla m n’ụzọ m na-aga ma dọrie m.*

O meela ka m tọgbọrọ chakoo.+

12 O kweela ụta ya, tụgidekwa m akụ́ ya.

ה [Hee]

13 Ọ gbaala akụ́* ndị dị n’akpa akụ́ ya n’akụrụ m.

14 Mmadụ niile na-achị m ọchị. Ha na-agụkwa egwú ha ji akwa m emo ụbọchị niile.

15 O meela ka m rijuo ihe na-elu ilu afọ, meekwa ka m tajuo ahịhịa na-elu ilu afọ.+

ו [Wọọ]

16 O meela ka m taa okwute tajie ezé.

O meela ka m tụrụọ ná ntụ.+

17 I meela ka obi ghara iru m ala.* Echefuola m ihe bụ́ aṅụrị.*

18 Ọ bụ ya mere m ji na-asị: “Mma m mara alaala n’iyi. Ihe m na-atụ anya inweta n’aka Jehova alaakwala n’iyi.”

ז [Zayin]

19 Cheta na m nọ n’ahụhụ nakwa na enweghị m ụlọ.+ Chetakwa na m na-ata ahịhịa na-elu ilu na ihe na-egbu mmadụ.+

20 Ị* ga-emecha cheta m. Ị ga-abịakwutekwa m* ma nyere m aka.+

21 M bu ihe a n’obi. Ọ bụ ya mere m ga-eji chere gị.+

ח [Het]

22 Ọ bụ ịhụnanya Jehova mere* na anyị anwụchabeghị,+

N’ihi na ebere ya anaghị agwụ agwụ.+

23 Ọ na-eme ebere kwa ụtụtụ.+ Ọ bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi mgbe niile.+

24 M* kwuru, sị, “Jehova bụ òkè m.+ Ọ bụ ya mere m ga-eji chere ya.”+

ט [Tet]

25 Jehova dị mma n’anya onye na-atụ anya ya+ nakwa n’anya onye* na-achọ ya.+

26 Ọ dị mma ka mmadụ gba nkịtị*+ chere ka Jehova zọpụta ya.+

27 Ọ dị mma ka nwoke buru yok ya n’oge ọ bụ okorobịa.+

י [Yod]

28 Ya nọrọ ọdụ naanị ya gbachi nkịtị, ebe ọ bụ na Chineke hapụrụ ya ka o buru ya.+

29 Ya jiri obi ya niile na-edi ya ma kpudo ihu n’ájá.+ Olileanya dị na e nwere ike inyere ya aka.+

30 Ya cheziere onye na-ama ya ụra ntì, ka mkparị jukwa ya afọ.

כ [Kaf]

31 N’ihi na Jehova agaghị ajụ anyị ruo mgbe ebighị ebi.+

32 Ọ bụ eziokwu na o mere ka anyị na-eru uju, ọ ga-emekwara anyị ebere n’ihi na ịhụnanya ya enweghị atụ.+

33 N’ihi na ịta ndị mmadụ ahụhụ ma ọ bụ ime ka ha na-eru uju anaghị atọ ya ụtọ.+

ל [Lamed]

34 Iji ụkwụ zọpịa ndị mkpọrọ nọ n’ụwa,+

35 Ikpe mmadụ ikpe mkpegbu n’ihu Onye Kacha Elu,+

36 Na ikpe mmadụ ikpe arụrụala,

Jehova kpọrọ ihe a niile asị.

מ [Mem]

37 Ònyezi nwere ike ikwu ka ihe mee, ihe ahụ emee mgbe Jehova na-ekwughị ka o mee?

38 Naanị ihe na-esi n’ọnụ Onye Kacha Elu apụta bụ ihe ọma.

Ihe ọjọọ anaghị esi n’ọnụ ya apụta.

39 Gịnị mere mmadụ dị ndụ ga-eji na-ekwu na obi adịghị ya mma maka na ọ na-ata ahụhụ mmehie ya?+

נ [Nun]

40 Ka anyị leruo àgwà anyị anya, chebakwara ya echiche,+ ka anyị laghachikwuru Jehova.+

41 Ka anyị gbasaara Chineke bi n’eluigwe aka anyị ma jiri obi anyị niile gwa ya, sị:+

42 “Anyị emehiela gị. Anyị enupụrụla gị isi.+ Ị gbagharabeghị anyị.+

ס [Samek]

43 I ji ezigbo iwe gbochie anyị ịbịakwute gị.+

Ị chụkwutela anyị ma gbuo anyị n’emeghị ebere.+

44 I jirila ígwé ojii gbochie anyị ịbịakwute gị, ka ekpere anyị ghara irute ebe ị nọ.+

45 I mere ka anyị dịrị ka ihe a jụrụ ajụ na ihe e kpofuru ekpofu n’anya mba dị iche iche.”

פ [Pee]

46 Ndị iro anyị niile na-agwa anyị okwu ọjọọ.+

47 Ụjọ na-atụ anyị mgbe niile. Olulu gbakwara anyị gburugburu.+ E bibiela anyị. Anyị tọgbọkwa nkịtị.+

48 Anya mmiri si m n’anya na-asọpụta ka iyi maka na e bibiela ndị m.*+

ע [Ayin]

49 M na-ebe ákwá n’akwụsịghị akwụsị,+

50 Ruo mgbe Jehova si n’eluigwe ledata anya hụ ihe na-eme anyị.+

51 Ahụsiela m* anya n’ihi ihe na-eme n’ime obodo niile dị n’obodo m.+

צ [Sadee]

52 E nweghị ihe m mere ndị iro m, ha ana-achụ nta m ka à ga-asị na m bụ nnụnụ.

53 Ha chọrọ igbu m n’ime olulu. Ha nọkwa na-atụ m nkume.

54 Mmiri rikpuru m, mụ asị: “Nke m agwụla!”

ק [Kof]

55 Jehova, esi m n’ime ime olulu kpọkuo aha gị.+

56 Nụrụ olu m. Emechila ntị gị mgbe m na-etiku gị ka i nyere m aka.

57 Ị bịakwutere m n’ụbọchị m kpọkuru gị. Ị sịrị m: “Atụla egwu.”

ר [Resh]

58 Jehova, i kpechitere ọnụ m.* Ị zọrọ mụ ndụ.+

59 Jehova, ị hụlanụ ihe ọjọọ e mere m. Biko, kpeere m ikpe ziri ezi.+

60 Ị hụlanụ ihe niile ha ji obi ọjọọ mee m, ya bụ, nkata ọjọọ niile ha kpaara m.

ש [Sin] ma ọ bụ [Shin]

61 Jehova, ị nụla ka ha na-akparị m, nụkwa nkata ọjọọ niile ha na-akpara m.+

62 Ị nụkwala ihe ndị na-emegide m na-ekwu nakwa izu ọjọọ ha na-agbara m ụbọchị niile.

63 Lewe ha. Ha na-agụ egwú ha ji achị m ọchị, ma mgbe ha nọ ọdụ ma mgbe ha guzo ọtọ.

ת [Tọọ]

64 Jehova, ị ga-akwụ ha ụgwọ ihe ha mere.

65 Ọnụ ị ga-abụ ha ga-eme ka ha kpọchie obi ha.

66 Jehova, ị ga-eji iwe chụọ ha ọsọ ma kpochapụ ha n’ụwa.

א [Alef]

4 Ọlaedo nke na-egbuke egbuke, nke bụ́ ezigbo ọlaedo, agbachuola.+

Nkume dị iche iche dị nsọ+ tọgbọgasị n’ebe niile ụzọ gbara mkpị.+

ב [Bet]

 2 Ụmụ Zayọn, bụ́ ndị a na-akwanyere ùgwù, dịbu* ka ọlaedo a nụchara anụcha.

Ma ugbu a, e weere ha ka nnukwu ite ụrọ,

Ya bụ, ọrụ aka ọkpụite.

ג [Gimel]

 3 Nkịta ọhịa na-enyedị ụmụ ha ara.

Ma, ndị m* aghọọla ndị obi tara mmiri+ ka enyí nnụnụ nọ n’ala ịkpa.+

ד [Dalet]

 4 Ire nwa na-aṅụ ara araparala n’okpo ọnụ ya n’ihi akpịrị na-akpọ ya nkụ.

Ụmụntakịrị na-arịọ ka e nye ha nri,+ ma e nweghị onye na-enye ha.+

ה [Hee]

 5 Agụụ emeela ka ndị na-eribu ezigbo nri tụbọọ* n’okporo ámá dị iche iche.+

Ndị na-eyi ákwà dị oké ọnụ kemgbe ha bụ ụmụaka+ na-edinazi n’ikpo ntụ.

ו [Wọọ]

 6 Ahụhụ a na-ata ndị m* maka mmehie ha akarịala nke a tara ndị Sọdọm maka mmehie ha.+

E bibiri Sọdọm n’otu ntabi anya. E nweghịkwa onye nyeere ya aka.+

ז [Zayin]

 7 Ndị Naziraịt+ nọ na Zayọn dịbu ọcha karịa snoo, na-achabu ọcha karịa mmiri ara ehi.

Ha na-achabu uhie uhie* karịa nkume kọral. Ha na-egbukebu egbuke dị ka nkume safaya.

ח [Het]

 8 Ha na-ejizi oji karịa unyì.*

A naghị ama ndị ha bụ n’okporo ámá.

Ha ataala ahụ́, bụrụzie ọkpụkpụ ọkpụkpụ.+ Ha dịzi ka osisi kpọrọ nkụ.

ט [Tet]

 9 Ọ kaara ndị e ji mma agha gbuo mma karịa ndị ụnwụ gburu.+

N’ihi na ezigbo ike na-agwụ ndị ụnwụ ji aka maka na nri adịghịzi, ha eyie ndị e ji ube magbuo.

י [Yod]

10 Ụmụ nwaanyị ndị na-emetaburu mmadụ ebere na-esizi ụmụ ha esi.+

Ha ji ha mere nri* n’oge e bibiri ndị m.*+

כ [Kaf]

11 Jehova egosila na ezigbo iwe ji ya.

Iwe ya dị ka ọkụ na-ere ere.+

O sunyekwala Zayọn ọkụ nke na-erechapụ ntọala ya.+

ל [Lamed]

12 Ndị eze ụwa na ndị niile bi n’elu ala ekwetaghị

Na onye mmegide na onye iro ga-abata n’ọnụ ụzọ ámá Jeruselem.+

מ [Mem]

13 Ihe a mere n’ihi ihe ndị amụma ya mehiere nakwa n’ihi ihe ndị nchụàjà ya mejọrọ,+

Bụ́ ndị na-egbu ndị ezi omume nọ na ya.+

נ [Nun]

14 Ha na-awagharị n’okporo ámá ka ndị kpuru ìsì.+

Ha ji ọbara merụọ onwe ha.+

Ọ bụ ya mere na e nweghị onye ga-anwa anwa metụ uwe ha aka.

ס [Samek]

15 Ndị mmadụ nọ na-eti mkpu, na-asị ha, “Ndị na-adịghị ọcha, pụọnụ! Pụọnụ! Pụọnụ! Unu emetụla anyị aka!”

Ndị amụma na ndị nchụàjà enweghịzi ebe ha ga-ebi. Ha na-awagharịzi awagharị.

Ndị obodo dị iche iche na-asị: “Ha agaghịzi ebi n’obodo anyị.+

פ [Pee]

16 Jehova achụsasịala ha.+

Ọ gaghịzi na-ele ha anya ọma.

Ndị mmadụ agaghị na-asọpụrụ ndị nchụàjà.+ Ha agaghịkwa na-emere ndị agadi amara.”+

ע [Ayin]

17 Anyị atụkatala anya ka e nyere anyị aka, anya akpọọ anyị. E nweghị onye nyeere anyị aka.+

Mba anyị nọ na-atụsi anya ike ka ha nyere anyị aka azọpụtalighị anyị.+

צ [Sadee]

18 Ndị iro anyị nọ na-achụgharị anyị ka ha jide anyị,+ nke na anyị enweghịzi ike ịna-agagharị n’okporo ámá anyị.

Oge anyị ga-anwụ eruola. Ụbọchị anyị agwụla, n’ihi na oge ọnwụ anyị eruola.

ק [Kof]

19 Ndị na-achụ anyị na-efe ọsọ karịa ugo.+

Ha chụrụ anyị ọsọ n’elu ugwu, chechiekwa anyị n’ala ịkpa.

ר [Resh]

20 Ọ bụ ná nnukwu olulu ha ka ha jidere+ onye Jehova tere mmanụ,+ onye dị ka ume anyị na-eku.

Anyị kwukwara gbasara ya, sị: “Ọ bụ ya ga na-echebe anyị ná mba dị iche iche anyị bi.”

ש [Sin]

21 Ịdọm* nke dị n’ala Ọz, ṅụrịwa ọṅụ.+ Obi tọwakwa gị ụtọ.

Ma, a ga-enye gị iko na-egosi na a ga-ebibi gị.+ Mmanya ga na-egbu gị. Ị ga-agbakwa onwe gị ọtọ.+

ת [Tọọ]

22 Zayọn,* ahụhụ a na-ata gị maka mmehie gị agwụla.

E nweghị onye ga-adọrọ gị n’agha ọzọ.+

Ma Ịdọm,* Chineke ga-elebara mmehie gị anya.

Ọ ga-agba mmehie gị n’anwụ.+

5 Jehova, biko, cheta ihe mere anyị.

Lee anya ka ị hụ otú e si menye anyị ihere.+

 2 E werela ihe anyị ketara nye ndị ala ọzọ, nyekwa ndị mba ọzọ ụlọ anyị.+

 3 Anyị aghọọla ụmụ na-enweghị nna. Nne anyị hà dịzi ka ụmụ nwaanyị isi mkpe.+

 4 Anyị na-ejizi ego azụ mmiri anyị+ na nkụ anyị.

 5 Ọ fọla ntakịrị ka ndị na-achụ anyị jide anyị.

Ike agwụla anyị, ma e kweghị anyị zuru ike.+

 6 Anyị na-asara Ijipt+ na Asiria+ aka ka ha nye anyị nri ga-eju anyị.

 7 Nna nna anyị hà ndị mehierenụ anọghịzi, ma anyịnwa na-ata ahụhụ mmehie ha.

 8 Ọ bụ ndị ohu na-achị anyị. E nweghị onye na-anapụta anyị n’aka ha.

 9 Ndị ji mma agha nọrọ n’ala ịkpa emeela ka anyị na-eme ihe nwere ike ịta isi anyị*+ iji nweta ihe anyị ga-eri.

10 Akpụkpọ ahụ́ anyị dịzi ọkụ ka ekwú ọkụ, n’ihi ịnọ agụụ.+

11 Ha menyere ụmụ nwaanyị ihere,* ma ụmụ nwaanyị a lụ alụ nọ na Zayọn ma ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke nọ n’obodo ndị dị na Juda.+

12 E kegidere aka ndị isi n’elu kwụgbuo ha.+ A kwanyereghị ndị agadi ùgwù.+

13 Ụmụ okorobịa bu nkume e ji egwe nri. Ụmụaka ndị nwoke bukwa nkụ na-adagharị.

14 Ndị agadi akwụsịla ịnọ n’ọnụ ụzọ ámá.+ Ụmụ okorobịa akwụsịkwala egwú ha na-akụ.+

15 Anyị anaghịzi enwe obi ụtọ. Anyị akwụsịla ịgba egwú, na-eruzi uju.+

16 Okpueze anyị kpu n’isi adapụla. Anyị efuola, n’ihi na anyị emehiela!

17 Ihe a emeela ka obi na-egbu anyị mgbu.+

Anya anyị na-ahụzi inyoghi inyoghi n’ihi ihe ndị a.+

18 Ugwu Zayọn tọgbọ nkịtị.+ Ọ bụzi ebe nkịta ọhịa na-awụgharị.

19 Ma gịnwa, bụ́ Jehova, ị ga-anọdụ n’ocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi.

Ocheeze gị ga-adịru ọgbọ niile.+

20 Gịnị mere i ji chefuo anyị ruo mgbe ebighị ebi? Gịnịkwa mere i ji hapụ anyị kemgbe?+

21 Jehova, biko, kpọghachite anyị n’ebe ị nọ. Anyị ga-ejikwa obi anyị niile lọghachikwute gị.+

Mee ka ihe dịrị anyị otú ọ dị n’oge gara aga.+

22 Ma, ị jụla anyị kpamkpam.

Ị ka na-ewesa anyị ezigbo iwe.+

Isi nke mbụ ruo anọ bụ abụ iru uju e dere n’usoro abịdịị ná mkpụrụ akwụkwọ Hibru.

Ma ọ bụ “ógbè.”

Na Hibru, “Ụmụ agbọghọ ya na-amaghị nwoke.”

Na Hibru, “ada bụ́ Zayọn.”

Ma ọ bụ “na-achụ.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ha.”

Jeruselem ka a kpọrọ nwaanyị n’amaokwu a.

Na Hibru, “nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ́ Juda.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”

Ma ọ bụ “ụmụ agbọghọ m.”

Ma ọ bụ “ka mkpụrụ obi ha dịghachi ndụ.”

Na Hibru, “Eriri afọ m.”

Na Hibru, “ada bụ́ Zayọn.”

Na Hibru, “ada bụ́ Juda.”

Na Hibru, “wepụ mpi Izrel.”

Na Hibru, “ada bụ́ Zayọn.”

Na Hibru, “ada bụ́ Zayọn.”

Ma ọ bụ “na-eso ntụziaka.”

Na Hibru, “ada bụ́ Zayọn.”

Na Hibru, “Ụmụ agbọghọ Jeruselem na-amaghị nwoke.”

Na Hibru, “Eriri afọ m.”

Na Hibru, “A wụsala imeju m n’ala.”

Na Hibru, “ada bụ́ ndị m.”

Na Hibru, “Olee nri na mmanya?”

Na Hibru, “Ada bụ́ Jeruselem.”

Na Hibru, “Ada na-amaghị nwoke bụ́ Zayọn.”

Na Hibru, “Ada bụ́ Jeruselem.”

Na Hibru, “ka mpi onye iro gi dị elu.”

Na Hibru, “Mgbidi ada bụ́ Zayọn.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ nke afọ ha?”

Na Hibru, “ụmụ agbọghọ m na-amaghị nwoke.”

O nwere ike ịbụ, “mee ka m tọgbọrọ nkịtị.”

Na Hibru, “ụmụ.”

Ma ọ bụ “ka mkpụrụ obi m ghara inwe udo.”

Na Hibru, “ihe dị mma.”

Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi gị.”

Na Hibru, “Ị ga-ehulatakwa.”

Ma ọ bụ “Ọ bụ ịhụnanya pụrụ iche Jehova na-egosi mere.”

Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi m.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “nwee ndidi.”

Na Hibru, “ada bụ́ ndị m.”

Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi m ahụsiela.”

Ma ọ bụ “i kpechiteere mkpụrụ obi m ọnụ ya.”

Ma ọ bụ “baburu ezigbo uru.”

Na Hibru, “ada bụ́ ndị m.”

Na Hibru, “tọgbọrọ nkịtị.”

Na Hibru, “ada bụ́ ndị m.”

Ma ọ bụ “ọbara ọbara.”

Na Hibru, “ọchịchịrị.”

Ma ọ bụ “nri ha ji eru uju.”

Na Hibru, “ada bụ́ ndị m.”

Na Hibru, “Ada bụ́ Ịdọm.”

Na Hibru, “Ada bụ́ Zayọn.”

Na Hibru, “ada bụ́ Ịdọm.”

Ma ọ bụ “igbu mkpụrụ obi anyị.”

Ma ọ bụ “Ha dinara ụmụ nwaanyị n’ike.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya