Abụ ọma Devid.
26 Kpee m ikpe,+ Jehova, n’ihi na mụ onwe m ejewo ije n’iguzosi ike n’ezi ihe nke m,+
Ọ bụkwa Jehova ka m tụkwasịrị obi, ka m wee ghara ịma jijiji.+
2 Jehova, nyochaa m, leekwa m ule;+
Nụchaa akụrụ m na obi m.+
3 N’ihi na obiọma gị dị n’ihu m,
Ejewokwa m ije n’eziokwu gị.+
4 Mụ na ndị ụgha adịghị anọkọ;+
Mụ na ndị na-ezochi ihe ha bụ adịghị akpakọrịta.+
5 M kpọrọ ọgbakọ nke ndị na-eme ihe ọjọọ asị,+
Mụ na ndị ajọ omume adịghịkwa anọkọ.+
6 M ga-akwọ aka m iji gosi na aka m dị ọcha,+
Jehova, m ga-agakwa ebe ịchụàjà gị gburugburu,+
7 Iji mee ka a nụ ekele m na-enye n’olu dara ụda,+
Nakwa iji kọsaa ọrụ gị niile dị ebube.+
8 Jehova, ahụrụ m ụlọ gị nke bụ́ ebe obibi gị n’anya+
Nakwa ebe ebube gị bi.+
9 Ewepụkọtala mkpụrụ obi m na ndị mmehie,+
Ewepụkọtakwala ndụ m na ndị ikpe ọbara mara,+
10 Bụ́ ndị na-eme omume rụrụ arụ,+
Ndị aka nri ha jupụtakwara n’iri ngarị.+
11 Ma mụ onwe m ga-eje ije n’iguzosi ike n’ezi ihe nke m.+
Napụta m+ ma meere m amara.+
12 Ụkwụ m ga-eguzo n’ebe dị larịị;+
M ga-agọzi Jehova n’etiti ìgwè ndị zukọrọ ọnụ.+