6 Ha ga-adị nsọ nye Chineke ha,+ ha agaghịkwa emerụ aha Chineke ha,+ n’ihi na ọ bụ ha na-esure àjà Jehova ndị a na-esure n’ọkụ, bụ́ ihe oriri Chineke ha;+ ha ga-adị nsọ.+
24 Ihe ndị a ka unu ga na-achụ n’àjà kwa ụbọchị ruo ụbọchị asaa dị ka ihe oriri,+ bụ́ àjà a na-esure n’ọkụ, nke na-esi ísì ụtọ nye Jehova.+ A ga-achụ ya na àjà nsure ọkụ ahụ a na-achụ mgbe niile, tinyere àjà ihe ọṅụṅụ ya.