3 Mozis wee sị Erọn: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Ka e doo m nsọ+ n’etiti ndị na-abịaru m nso,+ ka e nyekwa m otuto+ n’ihu mmadụ niile.’” Ma Erọn gbara nkịtị.
13 Ọ bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha ka unu ga-emeso dị ka onye dị nsọ,+ ọ bụkwa ya ka unu ga na-atụ egwu,+ ọ bụ ya bụ Onye kwesịrị ime ka unu na-ama jijiji.”+