24 ọkụ wee si n’ihu Jehova+ pụta malite irepịa àjà nsure ọkụ ahụ na abụba ndị ahụ dị n’elu ebe ịchụàjà. Mgbe ha niile hụrụ ya, ha malitere iti mkpu+ wee gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala.
20 O wee ruo mgbe ọkụ si n’ebe ịchụàjà ahụ nwulie elu, mmụọ ozi Jehova sooro ọkụ nke si n’ebe ịchụàjà ahụ rịgoo ka Manoa na nwunye ya nọ na-ele anya.+ Ha gburu ikpere n’ala ozugbo, kpudo ihu n’ala.+
26 Devid wee wuoro Jehova ebe ịchụàjà+ n’ebe ahụ, chụọkwa àjà nsure ọkụ na àjà udo. O wee kpọkuo Jehova,+ bụ́ onye zara ya site n’ọkụ+ nke si n’eluigwe daa n’elu ebe ịchụàjà nke àjà nsure ọkụ ahụ.