28 Mee Jọshụa onye ndú,+ gbaakwa ya ume ma mee ka ọ dị ike, n’ihi na ọ bụ ya ga-ebutere ndị a ụzọ mgbe ha na-agafe,+ ọ bụkwa ya ga-eme ka ha nweta ala ahụ ị ga-ahụ.’+
18 M wee gaa n’ihu ịgwa ha banyere aka+ Chineke m, otú o si dị mma n’ahụ́ m,+ nakwa ihe+ eze gwara m. Ha wee sị: “Ka anyị bilie, anyị ga-ewukwa ya.” Ha wee mee ka aka ha dị ike maka ọrụ ọma ahụ.+
25 ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị,+ dị ka ụfọdụ ndị na-emekarị, kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume,+ na-emekwa otú ahụ karị, ka unu na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.+