11 Onye ga-akpọ nnụnụ na-eri anụ ka o si n’ebe ọwụwa anyanwụ bịa,+ kpọọkwa onye ga-emezu ihe m kpebiri ka o si n’ala dị anya bịa.+ Ekwuwo m ya; m ga-emekwa ka o mezuo.+ Akpụwo m ya, m ga-emekwa ya.+
11 otú ahụ ka okwu m nke si n’ọnụ m pụta ga-adị.+ Ọ gaghị agba aka lọghachikwute m,+ kama ọ ga-eme ihe na-atọ m ụtọ,+ ọ ga-emezukwa ihe m zigara ya ka o mee.+
6 Otú ọ dị, ọ̀ bụ na okwu m na ụkpụrụ m ndị m nyere ndị ohu m, bụ́ ndị amụma,+ n’iwu emezughị n’isi nna unu hà?’+ Ha wee lọghachi, sị: ‘Ihe Jehova bu n’obi ime anyị+ dị ka ụzọ anyị na omume anyị si dị, ọ bụ ya ka o mere anyị.’”+