20 “Jehova ga-eme ka ọbụbụ ọnụ,+ ọgba aghara+ na ịba mba+ dakwasị gị n’ihe ọ bụla ị na-eme bụ́ nke ị na-agbalị ime, ruo mgbe e kpochapụrụ gị, i wee laa n’iyi ọsọ ọsọ, n’ihi omume ọjọọ gị, ebe ọ bụ na ị hapụwo m.+
43 Unu ga-anọkwa n’ebe ahụ cheta ụzọ unu niile+ na ihe niile unu mere, bụ́ ndị unu ji merụọ onwe unu,+ ihu unu ga-egosikwa na ihere onwe unu na-eme unu n’ihi ihe ọjọọ niile unu mere.+
15 “Ihe ọjọọ ha niile dị na Gilgal,+ n’ihi na ọ bụ n’ebe ahụ ka m nọ kpọ ha asị.+ M ga-achụpụ ha n’ụlọ m+ n’ihi ajọ omume ha. Agaghị m anọgide na-ahụ ha n’anya.+ Ndị isi ha niile na-eme isi ike.+