20 Ozugbo ahụ, Sọl zipụrụ ndị ozi ka ha gaa kpọta Devid. Mgbe ha hụrụ ndị mere okenye n’ime ndị amụma ka ha na-ebu amụma, hụkwa ka Samuel guzo dị ka onyeisi ha, mmụọ+ Chineke dakwasịrị ndị ozi Sọl, ha wee malite ime dị ka ndị amụma,+ ha onwe ha kwa.
3 Ụmụ ndị amụma+ ndị nọ na Betel pụtara bịakwute Ịlaịsha wee sị ya: “Ị̀ makwa na ọ bụ taa ka Jehova ga-ewepụ nna gị ukwu ka ọ ghara ịbụkwa onyeisi gị?”+ O wee zaa, sị: “Mụ onwe m kwa maara nke ọma.+ Gbanụ nkịtị.”
38 Ịlaịsha wee laghachi Gilgal,+ ma ụnwụ+ dị n’ala ahụ. Ka ụmụ+ ndị amụma nọ ọdụ n’ihu ya,+ o mesịrị gwa onye na-ejere ya ozi, sị:+ “Sinye nnukwu ite e ji esi nri n’ọkụ ma siere ụmụ ndị amụma ofe.”+