40 Ndị bi ha nso, ruo Ịsaka+ na Zebulọn+ na Naftalaị,+ jikwa ịnyịnya ibu+ na kamel na jakị na ehi na-ebute ihe oriri ndị e ji ntụ ọka* mee,+ mbadamba achịcha mkpụrụ fig+ na achịcha mkpụrụ vaịn a mịrị amị+ na mmanya+ na mmanụ+ na ehi+ na atụrụ,+ n’ụba, n’ihi na a na-aṅụrị ọṅụ+ n’Izrel.
6 M wee nụ ihe na-ada ka olu oké ìgwè mmadụ, dịkwa ka ụda nke ọtụtụ mmiri na ụda oké égbè eluigwe. Ha sịrị: “Toonụ Jaa,+ n’ihi na Jehova Chineke anyị, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,+ amalitewo ịchị achị dị ka eze.+