54 O wee kpọọ nwa okorobịa na-eburu ya ngwá agha ngwa ngwa, sị ya: “Mịrị mma agha gị gbuo m,+ ka ha ghara ikwu banyere m, sị, ‘Ọ bụ nwaanyị gburu ya.’” Onye na-ejere ya ozi wee magbuo ya ozugbo.+
13 Jọnatan wee jiri aka ya+ na ụkwụ ya na-agbago, onye na-eburu ya ihe agha sokwa ya n’azụ; ha wee malite ịda n’ihu Jọnatan,+ onye na-eburu ya ihe agha nọkwa na-egbu ha n’azụ ya.+
4 Sọl wee sị onye na-eburu ya ihe agha: “Mịrị mma agha gị+ maa m, ka ndị a a na-ebighị úgwù+ ghara ịbịa were mma agha ha magbuo m ma mee m ihe na-adịghị mma.” Ma obi ekweghị onye na-eburu ya ihe agha ime ya,+ n’ihi na egwu ji ya nke ukwuu. Sọl wee mịrị mma agha dakwasị na ya.+