3 Ndị isi ise+ nke ndị Filistia,+ na ndị Kenan niile,+ ọbụna ndị Saịdọn+ na ndị Haịvaịt+ ndị bi n’Ugwu Lebanọn,+ malite n’Ugwu Bel-hemọn+ ruo n’ebe e si abanye Hemat.+
16 “Ụdị ugbu a echi, m ga-ezitere gị otu nwoke si n’ala Benjamin,+ tee ya mmanụ+ ịbụ onye ndú nke ndị m bụ́ Izrel; ọ ga-azọpụtakwa ndị m n’aka ndị Filistia,+ n’ihi na ahụwo m mmekpa ahụ́ nke ndị m, mkpu ákwá ha eruwokwa m ntị.”+
7 “‘Unu ụmụ Izrel, ọ̀ bụ na unu adịghị ka ụmụ Kush n’anya m?’ ka Jehova kwuru. ‘Ọ̀ bụ na mụ esighị n’ala Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel,+ si na Krit kpọpụta ndị Filistia,+ sikwa na Kia+ kpọpụta Siria?’