1 Samuel 20:8 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 8 Ị ga-egosikwa ohu gị obiọma,*+ n’ihi na ndụ i mere ka gị na ohu gị gbaa bụ ọgbụgba ndụ+ Jehova. Ma ọ bụrụ na e nwere ihe m mejọrọ,+ jiri aka gị gbuo m, gịnị mere ị ga-eji kpọgara m nna gị?” 1 Samuel 20:42 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 42 Jọnatan wee sị Devid: “Laa n’udo,+ ebe anyị ṅụworo iyi,+ anyị abụọ, n’aha Jehova, sị, ‘Ka Jehova bụrụ onye akaebe n’etiti mụ na gị nakwa n’etiti ụmụ m na ụmụ gị ruo mgbe a na-akaghị aka.’”+ Devid wee bilie lawa, Jọnatan wee bata n’obodo. 1 Samuel 23:18 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 18 Ha abụọ wee gbaa ndụ+ n’ihu Jehova; Devid wee biri na Horesh, ma Jọnatan lara n’ụlọ ya. 2 Samuel 9:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 Devid wee sị: “Ọ̀ dị onye ọzọ fọdụrụ n’ụlọ Sọl, ka m wee gosi ya obiọma*+ n’ihi Jọnatan?”+ 2 Samuel 21:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Otú ọ dị, eze nweere Mefiboshet+ nwa Jọnatan nwa Sọl ọmịiko n’ihi iyi Devid na Jọnatan nwa Sọl ji aha Jehova ṅụọ.+
8 Ị ga-egosikwa ohu gị obiọma,*+ n’ihi na ndụ i mere ka gị na ohu gị gbaa bụ ọgbụgba ndụ+ Jehova. Ma ọ bụrụ na e nwere ihe m mejọrọ,+ jiri aka gị gbuo m, gịnị mere ị ga-eji kpọgara m nna gị?”
42 Jọnatan wee sị Devid: “Laa n’udo,+ ebe anyị ṅụworo iyi,+ anyị abụọ, n’aha Jehova, sị, ‘Ka Jehova bụrụ onye akaebe n’etiti mụ na gị nakwa n’etiti ụmụ m na ụmụ gị ruo mgbe a na-akaghị aka.’”+ Devid wee bilie lawa, Jọnatan wee bata n’obodo.
7 Otú ọ dị, eze nweere Mefiboshet+ nwa Jọnatan nwa Sọl ọmịiko n’ihi iyi Devid na Jọnatan nwa Sọl ji aha Jehova ṅụọ.+