19 Ọ ga-erukwa na onye ọ bụla nke si n’ọnụ ụzọ ụlọ gị pụọ n’èzí,+ ọbara ya ga-adị ya n’isi, ikpe agaghịkwa ama anyị; onye ọ bụla nke gị na ya nọ n’ụlọ a, ọbara ya ga-adị anyị n’isi ma ọ bụrụ na e bie ya aka.
24 ka ihe ike e mesoro ụmụ ndị ikom iri asaa nke Jerọbel wee dịrị n’isi ha,+ ka o wee meekwa ka ọbara ha dịrị n’isi Abimelek nwanne ha n’ihi na o gburu ha,+ ka ọ dịrịkwa n’isi ndị nwe ala Shikem n’ihi na ha nyeere ya aka+ igbu ụmụnne ya.
11 ma ya fọdụzie mgbe ndị ajọ omume+ gburu onye ezi omume n’ụlọ ya, n’elu ihe ndina ya! Ugbu a, ọ̀ bụ na mụ agaghị ajụta ọbara ya n’aka unu,+ ọ̀ bụ na mụ agaghịkwa ekpochapụ unu n’ụwa?”+
6 Ma mgbe ha nọ na-eguzogide ma na-ekwujọ ya,+ o fechara uwe+ ya wee sị ha: “Ka ọbara+ unu dị unu n’isi. Aka m dị ọcha.+ Site ugbu a gaa n’ihu, m ga-ejekwuru ndị mba ọzọ.”+