16 Ma ha ji ndị ozi nke ezi Chineke na-eme ihe ọchị,+ na-eledakwa okwu ya anya+ ma na-akwa+ ndị amụma ya emo, ruo mgbe ọnụma+ Jehova bịakwasịrị ndị ya, ruo mgbe ọ na-enweghị ihe ga-egbochi ya.+
14 Ụjọ na-atụ ndị mmehie nọ na Zayọn.+ Ahụ́ na-ama ndị si n’ezi ofufe dapụ jijiji,+ ha ana-asị: ‘Ònye n’ime anyị ka ya na ọkụ nke na-erepịa ihe pụrụ ibitụ?+ Ònye n’ime anyị ka ya na ọkụ nke na-agba ruo ogologo oge pụrụ ibitụ?’+
20 Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Lee! m ga-awụkwasị iwe m na ọnụma m n’ebe a,+ wụkwasịkwa ya ụmụ mmadụ na anụ ụlọ na osisi dị n’ọhịa+ na ihe ala mepụtara; iwe m ga-enwurukwa ọkụ, a gaghịkwa emenyụ ya emenyụ.’+
27 “‘“Ma ọ bụrụ na unu erubereghị m isi site n’ido ụbọchị izu ike nsọ, gharakwa ibu ibu,+ ma unu eburu ya na-abata n’ọnụ ụzọ ámá Jeruselem n’ụbọchị izu ike, m ga-esunye ọnụ ụzọ ámá ya niile ọkụ,+ ọ ga-erepịa ụlọ elu ndị dị na Jeruselem,+ a gaghịkwa emenyụ ya emenyụ.”’”+