16 Devid wee gwa ndị isi n’ime ndị Livaị ka ha mee ka ụmụnne ha bụ́ ndị ọbụ abụ+ jiri ngwá egwú,+ ụbọ akwara+ na une+ na ájà,+ guzoro tisiwe egwú ike ka e wee nụ mkpu ọṅụ.
4 O wee debe ụfọdụ n’ime ndị Livaị+ n’ihu igbe Jehova ka ha bụrụ ndị na-eje ozi,+ ka ha wee na-echetara ndị mmadụ ihe dị iche iche Jehova bụ́ Chineke Izrel mere,+ na-ekelekwa+ ya ma na-enye ya otuto,+
25Devid na ndị isi+ nke ìgwè dị iche iche ndị na-eje ozi+ wepụtakwara ụfọdụ n’ime ụmụ Esaf, ụmụ Himan+ na ụmụ Jedutọn,+ iche maka ije ozi, bụ́ ndị na-eji une+ na ụbọ akwara+ na ájà ebu amụma.+ E sikwa n’ime ha nweta ndị e nyere ọrụ ije ozi ha.
25 Ka nke a na-eme, o mere ka ndị Livaị+ jiri ájà+ na ụbọ akwara+ na une+ guzoro n’ụlọ Jehova, dị ka Devid+ na Gad+ bụ́ onye ọhụụ eze nakwa Netan+ onye amụma nyere n’iwu, n’ihi na ọ bụ Jehova nyere iwu ahụ site n’ọnụ ndị amụma ya.+
10 Mgbe ndị ahụ na-ewu ụlọ tọrọ ntọala+ ụlọ nsọ Jehova, ndị nchụàjà, bụ́ ndị yi uwe ndị nchụàjà+ ma jiri opi,+ na ndị Livaị bụ́ ụmụ Esaf,+ ndị ji ájà,+ biliri ito Jehova dị ka ntụziaka Devid bụ́ eze Izrel nyere si dị.+