1 Samuel 15:22 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 22 Samuel wee sị: “Àjà nsure ọkụ na àjà nkịtị hà na-atọ Jehova ụtọ+ dị ka irube isi n’ihe Jehova kwuru? Lee! Irube isi+ dị mma karịa àjà,+ ịṅa ntị dịkwa mma karịa abụba+ ebule; Abụ Ọma 51:16 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 16 N’ihi na ịchụrụ gị àjà adịghị atọ gị ụtọ—ma ọ́ bụghị ya, m gaara achụ ya;+Àjà a na-esurecha n’ọkụ adịghị atọ gị ụtọ.+ Aịzaya 1:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 “Olee uru ọtụtụ àjà unu na-achụ baara m?” ka Jehova kwuru. “Àjà ebule+ a na-esurecha n’ọkụ+ nakwa abụba nke anụ mara abụba+ agbụla m; ọbara+ nwa oké ehi na nke nwa ebule na nke mkpi+ adịghịkwa atọ m ụtọ.+ Hosia 6:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 N’ihi na ihe na-atọ m ụtọ bụ obiọma,+ ọ bụghị àjà;+ ịmara Chineke na-atọkwa m ụtọ, ọ bụghị àjà a na-esurecha n’ọkụ.+ Matiu 12:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Otú ọ dị, a sị na unu ghọtara ihe nke a pụtara, ‘Achọrọ m ebere,+ ọ bụghị àjà,’+ unu agaraghị ama ndị ikpe na-amaghị ikpe. Ndị Hibru 10:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 Ya mere, mgbe ọ bịara n’ụwa, o kwuru, sị: “‘Ị chọghị àjà na onyinye,+ kama ị kwadebeere m ahụ́.+
22 Samuel wee sị: “Àjà nsure ọkụ na àjà nkịtị hà na-atọ Jehova ụtọ+ dị ka irube isi n’ihe Jehova kwuru? Lee! Irube isi+ dị mma karịa àjà,+ ịṅa ntị dịkwa mma karịa abụba+ ebule;
16 N’ihi na ịchụrụ gị àjà adịghị atọ gị ụtọ—ma ọ́ bụghị ya, m gaara achụ ya;+Àjà a na-esurecha n’ọkụ adịghị atọ gị ụtọ.+
11 “Olee uru ọtụtụ àjà unu na-achụ baara m?” ka Jehova kwuru. “Àjà ebule+ a na-esurecha n’ọkụ+ nakwa abụba nke anụ mara abụba+ agbụla m; ọbara+ nwa oké ehi na nke nwa ebule na nke mkpi+ adịghịkwa atọ m ụtọ.+
6 N’ihi na ihe na-atọ m ụtọ bụ obiọma,+ ọ bụghị àjà;+ ịmara Chineke na-atọkwa m ụtọ, ọ bụghị àjà a na-esurecha n’ọkụ.+
7 Otú ọ dị, a sị na unu ghọtara ihe nke a pụtara, ‘Achọrọ m ebere,+ ọ bụghị àjà,’+ unu agaraghị ama ndị ikpe na-amaghị ikpe.