28 E nwere ihe yiri ụta+ nke na-apụta n’ígwé ojii n’ụbọchị mmiri na-ezo. Ọ bụ otú ahụ ka ìhè nke na-enwu gburugburu ya dị. O yiri ebube Jehova.+ Mgbe m hụrụ ya, m gburu ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala,+ m wee malite ịnụ olu onye ahụ nke na-ekwu okwu.
9 “Anọ m na-ele anya ruo mgbe e debegasịrị ocheeze,+ Onye Ochie ahụ+ wee nọdụ ọdụ. Uwe ya na-acha ezigbo ọcha,+ ntutu dị ya n’isi dị ka owú dị ọcha.+ Ocheeze ya bụ ire ọkụ ire ọkụ;+ ụkwụ ya bụ ọkụ na-ere ere.+