Job 9:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 Ọ na-eme oké ihe ndị a na-apụghị ịchọpụtacha achọpụtacha,+Na ihe dị ebube a na-apụghị ịgụta ọnụ.+ Job 42:2 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 2 “Amatawo m na i nwere ike ime ihe niile,+Ọ dịghịkwa ihe ọ bụla i zubere nke ị na-apụghị ime.+ Abụ Ọma 92:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 Lee ka ọrụ gị si dị ukwuu, Jehova!+Echiche gị miri emi nke ukwuu.+ Abụ Ọma 98:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 98 Bụkuonụ Jehova abụ ọhụrụ,+N’ihi na ihe ndị o mere dị ebube.+Aka nri ya, ya bụ, ogwe aka ya nke dị nsọ, enwetaworo ya nzọpụta.+ Abụ Ọma 104:24 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 24 Jehova, lee ka ọrụ gị si dị ọtụtụ!+I ji amamihe rụọ ha niile.+Ụwa jupụtara n’ihe ị rụrụ.+ Abụ Ọma 139:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 M ga-eto gị n’ihi na i kere m n’ụzọ dị egwu, dịkwa ebube.+Ọrụ gị dị ebube,+Dị ka mkpụrụ obi m maara nke ọma.+ Aịzaya 40:12 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 12 Ònye jiworo ọbụ aka ya tụọ osimiri n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀,+ werekwa ọbụ aka ya tụọ eluigwe,+ wụnyekwa ájá dị n’ala n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀,+ ma ọ̀ bụ jiri ihe ọ̀tụ̀tụ̀ tụọ ugwu ukwu, jirikwa ihe e ji atụ̀ ihe tụọ ugwu nta? Mkpughe 15:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 Ha na-abụkwa abụ Mozis+ bụ́ ohu Chineke, na abụ Nwa Atụrụ ahụ,+ sị: “Ọrụ gị dị ukwuu ma dị ebube,+ Jehova Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+ Ụzọ gị ziri ezi, bụrụkwa eziokwu,+ Eze mgbe ebighị ebi.+
98 Bụkuonụ Jehova abụ ọhụrụ,+N’ihi na ihe ndị o mere dị ebube.+Aka nri ya, ya bụ, ogwe aka ya nke dị nsọ, enwetaworo ya nzọpụta.+
14 M ga-eto gị n’ihi na i kere m n’ụzọ dị egwu, dịkwa ebube.+Ọrụ gị dị ebube,+Dị ka mkpụrụ obi m maara nke ọma.+
12 Ònye jiworo ọbụ aka ya tụọ osimiri n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀,+ werekwa ọbụ aka ya tụọ eluigwe,+ wụnyekwa ájá dị n’ala n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀,+ ma ọ̀ bụ jiri ihe ọ̀tụ̀tụ̀ tụọ ugwu ukwu, jirikwa ihe e ji atụ̀ ihe tụọ ugwu nta?
3 Ha na-abụkwa abụ Mozis+ bụ́ ohu Chineke, na abụ Nwa Atụrụ ahụ,+ sị: “Ọrụ gị dị ukwuu ma dị ebube,+ Jehova Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+ Ụzọ gị ziri ezi, bụrụkwa eziokwu,+ Eze mgbe ebighị ebi.+