6 Jehova wee gafee n’ihu ya, kpọsaa, sị: “Jehova, Jehova, Chineke nke na-eme ebere,+ na-emekwa amara,+ onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ,+ onye obiọma*+ ya na eziokwu ya dị ukwuu,+
8 Ị chọpụtakwara na o kwesịrị ntụkwasị obi n’ebe ị nọ;+ gị na ya wee gbaa ndụ+ na ị ga-enye ya ala ndị Kenan, ndị Het, ndị Amọraịt na ndị Perizaịt na ndị Jibọs na ndị Gegash, na ị ga-enye mkpụrụ ya ala ahụ;+ i wee mezuo okwu gị, n’ihi na ị bụ onye ezi omume.+
25 Chineke wepụtara ya dị ka àjà ime udo;+ udo a na-abịa site n’inwe okwukwe n’ọbara ya.+ Nke a bụ iji gosi ezi omume nke ya, n’ihi na ọ na-agbaghara mmehie+ ndị e mere n’oge gara aga mgbe Chineke nọ na-enwe ndidi;+