-
2 Ndị Eze 17:15Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
15 ha wee na-ajụ ụkpụrụ ya na ọgbụgba ndụ ya+ nke ya na ndị nna nna ha gbara, tinyere ihe ncheta ya+ ndị o ji dọọ ha aka ná ntị, ha wee na-eso arụsị na-abaghị uru,+ ha onwe ha wee ghọọ ndị na-abaghị uru,+ dị ka mba ndị gbara ha gburugburu, bụ́ ndị Jehova nyere ha iwu banyere ha ka ha ghara ime dị ka ha.+
-
1 Ihe E Mere 28:9Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
9 “Ma gị onwe gị, Sọlọmọn nwa m, mara+ Chineke nke nna gị, jirikwa obi gị dum+ na mkpụrụ obi jupụtara n’aṅụrị+ jeere ya ozi;+ n’ihi na Jehova na-enyocha obi niile,+ ọ na-amatakwa ihe niile mmadụ na-eche n’echiche.+ Ọ bụrụ na ị chọọ ya, ọ ga-ekwe ka ị chọta ya;+ ma ọ bụrụ na ị hapụ ya,+ ọ ga-ajụ gị ruo mgbe ebighị ebi.+
-
-
-