2 Ọtụtụ mba ga-ejekwa, sị: “Bịanụ+ ka anyị gbagoo n’ugwu Jehova, n’ụlọ Chineke nke Jekọb;+ ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya,+ anyị ga-ejekwa ije n’ụzọ ya.”+ N’ihi na ọ bụ na Zayọn ka iwu ga-esi pụta, okwu Jehova ga-esikwa na Jeruselem pụta.+
14M wee hụ, ma, lee! Nwa Atụrụ+ ahụ ka o guzo n’Ugwu Zayọn,+ ya na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ,+ bụ́ ndị e dere aha ya na aha Nna ya+ n’egedege ihu ha.