2 E nwere ọhụụ siri ike+ a kọọrọ m: Onye aghụghọ na-aghọ aghụghọ, onye na-ebukọrọ ihe mmadụ na-ebukọrọkwa ihe mmadụ.+ Ilam, gbagoo! Midia,+ nọchibido ya! Emewo m ka ude niile a na-asụ n’ihi ya kwụsị.+
33Ahụhụ ga-adịrị gị onye na-ebukọrọ ihe ndị mmadụ ma e nweghị onye na-ebukọrọ nke gị, gị onye na-aghọ ndị ọzọ aghụghọ, ma e nweghị onye na-aghọ gị aghụghọ!+ Ozugbo i bukọsịịrị ihe ndị mmadụ, a ga-ebukọrọ nke gị.+ Ozugbo ị ghọsịrị ndị ọzọ aghụghọ, a ga-aghọ gị aghụghọ.+