33 “N’ihi na nke a bụ ọgbụgba ndụ+ mụ na ụlọ Izrel ga-agba mgbe ụbọchị ndị ahụ gasịrị,”+ ka Jehova kwuru. “M ga-etinye iwu m n’ime ha,+ m ga-edekwa ya n’obi ha.+ M ga-abụ Chineke ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.”+
3 N’ihi na e gosiwo na unu bụ akwụkwọ ozi Kraịst nke anyị onwe anyị bụ́ ndị ozi dere,+ nke a na-ejighị ink dee, kama e ji mmụọ+ nke Chineke dị ndụ dee ya, ọ bụghị ná mbadamba nkume,+ kama ná mbadamba anụ ahụ́, ya bụ, n’obi.+