31 E mesịa, Tira kpọọrọ Ebram nwa ya nakwa Lọt, nwa nwa ya,+ bụ́ nwa Heran, nakwa Seraị+ bụ́ nwunye nwa ya, bụ́ nwunye Ebram nwa ya, ha na ya wee si n’obodo Ọọ nke ndị Kaldia pụọ gawa ala Kenan.+ Ka oge na-aga, ha bịarutere Heran+ wee biri n’ebe ahụ.