7 “N’ihi na nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Lee, m ga-esi n’ebe ugwu kpọta Nebukadreza eze Babịlọn,+ bụ́ eze ndị eze,+ ya na ọtụtụ ịnyịnya+ na ụgbọ ịnyịnya agha+ na ndị agha ịnyịnya na ìgwè mmadụ,+ bụ́ oké ìgwè mmadụ, ka ha buso Taya agha.
19 “Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Lee, m ga-enyefe Nebukadreza bụ́ eze Babịlọn ala Ijipt,+ ọ ga-eburu akụ̀ ya, meekwa ka ọ bụrụ ihe nkwata buru ibu,+ bukọrọkwa ihe dị ukwuu na ya; ọ ga-aghọkwa ụgwọ ọrụ nke ndị agha ya.’
6 N’ihi na, lee, m ga-eme ka ndị Kaldia bilie,+ bụ́ mba nwere obi ilu nke na-emekwa ihe ọsọ ọsọ, nke na-aga n’ebe ndị sara mbara n’ụwa iji weghara ebe obibi ndị na-abụghị nke ya.+