15 “Ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na i geghị ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke gị site n’ilezi anya debe iwu ya niile na ụkpụrụ ya ndị m na-enye gị taa, nkọcha a niile ga-abịakwasị gị ma chụkwute gị:+
15 Ọ ga-erukwa na, dị nnọọ ka okwu ọma niile Jehova bụ́ Chineke unu gwara unu mezuru n’isi unu,+ otú ahụ ka Jehova ga-eme ka ihe ọjọọ niile bịakwasị unu ruo mgbe o kpochapụrụ unu n’ezi ala a nke Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu,+
27 Kama Jehova sịrị: “M ga-ewepụkwa Juda+ n’ihu m,+ dị nnọọ ka m wepụrụ Izrel;+ m ga-ajụkwa obodo a nke m họọrọ, ya bụ, Jeruselem, nakwa ụlọ ahụ nke m kwuru banyere ya, sị, ‘Aha m ga-adịgide na ya.’”+
3 “‘M ga-enyefekwa ha n’aka ụzọ ihe anọ,’+ ka Jehova kwuru, ‘ka mma agha gbuo ha, ka nkịta dọkpụrụ ha, ka anụ ufe nke eluigwe+ na anụ ọhịa nke ụwa rie ha ma laa ha n’iyi.