-
Jeremaya 21:7Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
7 “‘“Mgbe nke ahụ gasịrị,” ka Jehova kwuru, “m ga-enyefe Zedekaya bụ́ eze Juda na ndị na-ejere ya ozi na ndị ya, tinyere ndị ọrịa na-efe efe na mma agha na ụnwụ gbufọrọ n’obodo a n’aka Nebukadreza bụ́ eze Babịlọn nakwa n’aka ndị iro ha nakwa n’aka ndị na-achọ mkpụrụ obi ha, ọ ga-ejikwa ihu mma agha gbuo ha.+ Ọ gaghị emere ha ebere, ọ gaghịkwa enwe ọmịiko ma ọ bụ nwee obi ebere n’ebe ha nọ.”’+
-
-
Jeremaya 25:9Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
9 lee, m ga-ezi ozi, m ga-akpọtakwa ezinụlọ niile si n’ebe ugwu,”+ ka Jehova kwuru, “zigara Nebukadreza eze Babịlọn, bụ́ ohu m,+ ozi, m ga-emekwa ka ha bịa buso ala a+ na ndị bi n’ime ya na mba ndị a niile gbara ya gburugburu agha;+ m ga-ebibi ha ma mee ka ha bụrụ ihe ijuanya na ihe a ga-afụrụ mkpọrọhịhị+ na ebe a ga-ala n’iyi ruo mgbe a na-akaghị aka.+
-