17 n’ihi na ha ahapụwo m wee gaa na-esurere chi ọzọ dị iche iche ihe nsure ọkụ+ ka ha wee jiri ihe niile ha ji aka ha rụọ+ kpasuo m iwe, e mewokwa ka ọnụma m nwuru ọkụ megide ebe a, a gaghịkwa emenyụ ya emenyụ.’”’+
13 Jehova, olileanya Izrel,+ ihere ga-eme ndị niile hapụrụ gị.+ Ndị si n’ife m ofufe dapụ,+ a ga-ede aha ha n’ájá, n’ihi na ha ahapụwo isi iyi nke mmiri na-enye ndụ, bụ́ Jehova.+